You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndị na-ere mgbọrọgwụ na mkpa akwụkwọ aga-anọzị ofe?
Gọọmentị ekewapụtala ngalaba ga-eleba anya n'ọgwụ ọdịnaala eji agwọ iba.
Minista na-ahụ maka ahụike n'ala Naịjirịa bụ Isaac Adewole kwuru nke a ka ya na onyeisiala na minista ndị ọzọ nwechara nzụkọ ụnyahụ.
O kwuru na ngalaba a ga-edu nchọpụta ogwụ ọdịnaala ndị ọzọ eji agwọ ọria.
Adewole kwuru na gọomenti etiti kwetekwara ka ejiri ọgwụ akpọrọ ''Naprisan'' wee gwọọ ọrịa ọbara bekee kpọrọ sikulu selu.
N'ọnu ya, nke a bụ mgbe mbụ a ga-enwe udiri ngalaba a na Naịjirịa nke ọrụ izizi ha ga-abụ ị chọta ọgwụgwọ iba n'ọhịa''.
O kwuru na nzụkọ a ha na onyeisiala nwere ụnyaahụ, kpebiri ka enwee nkwekọrita n'etiti ụlọọrụ akpọrọ ''National Institute for Pharmaceutical Research and Development'' na May and Baker Plc
iji mee ka ọgwụ Niprisan rute ndị na-arịa ọria sikulu selụ ọsịsọ.
Adewole kwuru na ihe ruru pasentị 25 ndị Naịjirịa nwere ọrịa sikulu selụ mana enweteghị ezigbo ọgwụ eji agwọ ya, nke mere na ọ na-egbu ọtụtụ n'ime ha ọsịsọ.
O kwuru na n'ime ọgbakọ a, na ha kwetere ị nweputa ego kariri nde nari asatọ na iri anọ (N840,000,000) iji rụpụta ụlọọgwụ na-eleta ndị ihe mberede mere na ''Federal medical centre Owerri.''