You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ọnwụnwa ọzọ abịarala Dino?
Ngalaba na-ahụ maka ntụliaka na Naijiria bụ INEC n'aha ịchafụ ebidola usoro iji wepu Sineto Dino Melaye n'oche ọchịchị n'obodo ya bụ Kogi.
Onye na-anọchite anya INEC na Kogi steeti bụ Ọkachamara James Apam kwuputara nke a taa ebe ha bidoro ị nyocha ndị denyere aha ntụliaka n'obodo ya.
Cheta na ụlọikpe enyebula INEC ikike ị ga niru were bido nwepu a a ga-eme Melaye ga-ebido n'ezie n'ụbochi satọday na-abịa.
Dino Melaye bụ sinetọ ndị uweojii na-agba mgbo ị nwuchi ka ọ zaa ajụjụ maka okwu ụgha ọ gwara ndị uweojii na ndị omekome wakporo ụgbọala ya.
Ndị ụlọọrụ sineti sọnyere osote onyeisioche ha bụ Bala Na'Allah ị ga leta Dino Melaye ebe ọ nọ n'ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ.
Akụkọ kwuru na ọ merụrụ ahụ ebe ọ na-achọ ị gbapụ ọsọ nwere onwe ya n'aka ndị uweojii mgbe ha kpụ ya a ga ụlọ mkpọrọ.
Minista ochie Naịjirịa bụ Femi Fani-Kayode akatọla emume Melaye na-eme n'elu igwe okwu soshal midia:
Akụkọ ga-amasị gị: