You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Mgba egwu Dino Melaye na ndị uweojii
Dino Melaye ka na-ewukwa na Naịjirịa ka ya na ndị uweojii na-eme 'mbe na abụọ nke bụ oke' n'Abuja.
Cheta na ndị uweojii kwuru na Melaye, bụ onye na-anọchite anya Kogi sentralụ n'ụlọomeiwu ukwu n'Abụja, bụ onye ha na-achọ achọ makana na o nwere azịza ọnu banyere okwu ndị ojiegbe aka ji na Kogi steeti.
Ugbua, ndị uweojii anwụchiela Dino Melaye, mana tupu anwụchie ya, ọtụtụ ihe mere.
Ndị uweojii kwuru na oge ha nwụchiri Melaye ụnyaahụ, ụgbọala abụọ gbochiri ụzọ ha n'Abuja. Ha kwuru na oge ihe a mere, Dino si na mpio ụgbọala ọ nọ n'ime ya wụpụ.
Ha kwukwara na ha nwụchiri Melaye ọzọ n'otu ụlọọgwụ ebe ọ na-ara ọgwụ maka ahụ o merụrụ oge o wụpụrụ.
Mana onye ọkaiwu ya gwara BBC na ọ bụ ndị uweojii kwapụrụ Melaye na mpio ahụ.
Uweojii 200
Nwụchi Melaye dị ka ihe nkiri Hollywood.
Ndị uweojii ruru 200 bụ ndị e dunyere ịnwuchie Dino Melaye. Ihe a bụ ihe butere ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ ugbua.
"Gịnị mere ndị nchekwa ala jiri zipu ndị uweojii 200 ka ha nwụchie otu nwoke, ebe ndị ji egbe na-egbu ọtụtụ mmadụ na Benue steeti?"
Onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara nchekwa obodo bụ Emeka Monye, gwara BBC Igbo na ụdịrị ihe a na-atụ n'anya.
O kwuru na: "Ihe a bụ okwu ndọrọndọrọ ochịchị. Ihe mere ka ọ dị njọ bụ na egbuola ọtụtụ mmadụ na mpaghara ugwu hausa, mana onweghị ihe gọọmentị Naịjirịa na-eme, gịnị mere okwu Dino Melaye jiri dị iche?"
Mana ọkaiwu Ebuka Iwuezi, kwuru na ndị uweojii na-arụ ọrụ ha dịka iwu ala siri kwuo.
O kwuru na: "Onye ọ bụla nwere ikpe ọbụla gbasara ịnupu isi n'iwu, ọ bụ ọrụ ndị uweojii ịnwụchi onye ahụ. Anaghị ekwu na makana ihe ọjọọ na-eme na Benue anaghị arụ ọrụ ya."
Gịnị ga-eme Dino Melaye n'ihu?
Onyeisi ndị uweojii Idris Ibrahim kwuru na ha ga-ekpe okwu Melaye n'ulọ ikpe kpam kpam.
O kwuru na ha ka na-enyocha ndị enyemaka chọrọ ịzọpụta Melaye n'aka ndị uweojii.