You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nwodo sị ka otu ndị ugwu sị ka eweghachite Ruga gbara ọgwụ ha ṅụọ
Otu jikọta ndị Igbo bụ Ohaneze ndị Igbo ekwuola na okwu otu akpọrọ "Coalition of Northern Groups" kwuru banyere atụmatụ Ruga adabaghi ma ncha.
Onyeisi Ohaneze bụ Nnia Nwodo kwuru nke ka ọ na asa okwu Abdulazeez Suleman kwuru na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụko mere ụnyaahụ bụ ụbọchị anọ nke ọnwa Juun.
Na mkparịtaụka ahụ, Maazị Suleman nyere gọọmentị etiti abali 30 iji weghachite atụmatụ Ruga.
Maazị Nwodo sị na jọgbụrụ udele sigbuo nkakwụ makana o megidere iwu.
Ọ sị, "Suleman gara n'ihu tie aka na ha ga-achupu ndị Ọdịda Anyanwu bi n'Ugwu. Okwu a dị ka okwu ndị ntoroọbịa ugwu kwuru mgbe ha sị na ha ga-achụpụ ndị ndịda Naịjirịa bi n'ugwu afọ abụọ gara aga."
Nnia Nwodo sị na Ohaneze anaghi egbochi ndị mmadụ isi Ugwu nata, ma ya bụru na ndị Ugwu bi Ọwụwa Anyanwụ ga-ala kwu.
Ukwu Ruga malitere ka gọọmentị etiti kwuru na ọ ga amalite atụmatu ahu iji kwụsịlata esemokwu na-ada n'etiti ndị ọchị ehi na ndị ọkọ ugbo n'ọtụtụ mpaghara Naịjirịa.
Agbanyeghị na gọọmentị sị na atụmatụ a abụghi ihe mmmmmmanye, ọtụtụ mmadụ, ọkachasị ndị si ndịda Naịjirịa si na ha achọghị ya.
Gọọmentị sị na ha wezugara atụmatụ ahụ maka adabanyeghị n'atụmatụ ọzọ akpọrọ "National Livestock Transformation Plan" (NLTP) bụ nke Osote Onyeisiala Osinbajo na-ahazị.