You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ruga Settlement esoghi n'ihe ngalaba m na-elekọta hibere - Yemi Osibanjo
Akụkọ nke ụtụtụ a
Osinbajo si na ọbụghị ya ahazị n'atụmatụ Ruga
Osote Onyeisiala bụ Yemi Osinbajo ekwuola na ọbụghị ya na-elekọta atụmatụ Ruga settlement ehibere maka ndị ochịehi.
Ọnụ na-ekwuru ya bụ Laolu Akande kọwara na Ruga di iche na nke a kpọrọ 'National Livestock Transformation Plan' bụ nke Osinbajo na-ahazị.
Ọkaikpe enyela EFCC ikike inye gọọmentị nde naira 49 na hụrụ na Kaduna
Ngalaba gọọmentị na-ahụ maka mgbochi nrụrụaka bụ EFCC enwetala ikike iweghachiri gọọmenti Nigeria ego di nde naira iri anọ na itoolu bụ nke ha nwụchiri na ogige ụgbọelu dị na Kaduna n'ọnwa March 2017.
Ọkaikpe Lawal Shuaibu nyere ikike ka eweghachiri gọọmenti Nigeria ego ahụ dika ọchụpụchara mmadu ole ma ole bịara kwuo na ọ bụ ego ha.
N'ofesi,
Onyeisiala America bụ Donald Trump ekwuola na ọ ga-amasi ya izute onyeisiala North Korea bụ Kim Jong Un mgbe ọ ga-aga mba South Korea na ọdị nso a.
Ndị North Korea sara sị na atumatụ ahụ ga-amasikwa ha mana ha anatabeghi ozi ọbula si n'aka Trump.
N'egwuregwu,
Moroco agafeela n'agba nke abụọ AFCON dika ha ji otu ọkpu goolu asataghị asata merie Ivory Coast ụnyaahu, Saụt Afịrịka ji otu ọkpụ goolu merie Namibia, ebe Tunishia na Mali gbara onwe ha onye lawa onye lawa.
Ụmụnwanyị Amerịka jikwa ọkpụ goolu abụọ asatara otu wee merie Frans iji gafee n'agba semi-final nke iko mba uwa nke umunwanyi ụnyaahu.
Gee nkeji ndị ebe a:
Lee ihe nkiri anyị nke taata: