You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ruga Settlement: O nweghi mpaghara ala Igbo so na Ruga - Emma Uzo
Ọtụtụ akụkọ dị n'ikuku maka ogige ndị Fulani na-achị ehi akpọrọ Ruga bụ nke gọmenti etiti chọrọ itinye ego na ya.
Ọtụtụ edemede depụtara steeti ebe gọmenti etiti sị na ha ga-amalite ile ya bụ atụmatụ nnu.
BBC Chọpụtara na o nweghi steeti ọwụwaanyanwụ so na ya.
Ojeozi Gọvanọ Ebonyi steeti na mgbasaozi bụ Emma Uzo kwuru hoohaa "na o nweghi mgbe steeti Alaigbo ji soro na ya bụ atụmatụ Ruga".
Steeti tinyere aha ha na ya bụ ihe bụ ndị ugwu, mpaghara Ugwu ọwụwaanyanwụ 'North-East' na ugwu Ọdịda anyanwụ 'North West'.
Gọmenti etiti kwukwara na-anaghị amanye ndị ọbụla amanye iwepụta ala ebe a ga-arụ ya bụ ogige Ruga.
Onye ọkaikpe anyị gbara ajụjụ bụ Ugo Egbujo kwụrụ na steeti iri na abụọ bụ ndị akpọrọ aha ha na ya bụ atụmatụ bụ ndị gosiri mmasị na ya bụ ihe.
Egbujo na-ekwụ na "iwu Naịjirịa enyeghị gọmenti etiti ikike ịkpara ala ọbụla n'ike".
Ọ sị n'ala niile dị gọmenti steeti n'aka, bụ ndị ọ dị n'aka ilete ya anya.
Gọmenti etiti ekwụọla na ha enweghi echiche ịnara steeti ọbụla ala n'ike.
Ha sị na ọ bụ steeti ndị etinyeghi aha ha bụ ndị na-ebutere ya bụ emume ajọ aha.
Steeti ndị so nwee Ruga
1. Sokoto
2. Adamawa
3. Nasarawa
4. Kaduna
5. Kogi
6. Taraba
7. Katsina Plateau
8. Kebbi
9. Zamfara
10. Niger.