You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị n'abalị a: Ndị ọchi ehi awakpola ụlọakwụkwọ na Jalingo
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Ndị ọchị ehi awakpola ụlọakwụkwọ ndị Katọlik
Ndi o ji egbe a na-eche ka ọ bụ ndị ọchi ehi wakporo ụlọakwụkwọ Secret Heart Minor Seminary dị na Jalingo nke Taraba Steeti n'isi ụtụtụ taa.
Ha gbajiri otu onye ụkọ chukwu akpọrọ Cornelius Koba ụkwụ ma mebie nwga ụlọ ruru ọtụtụ nde naịra.
Mụ na Rochas anaghị ese okwu
Osote gọvanọ Imo Steeti bụ Prince Eze Madumere agọrọla ụkwụ na aka ya na-akụkọ kwuru na ndị mmadụ chọrọ ka ya na Gọvanọ Rochas mee udo
Madumere kwuru na ya na Rochas anaghị ese okwu kama na ha nwere nghọtaghe n'echiche na usoro.
Akụkọ mba ofesi;
Mba Fransị echiela Nwafọ mba Mali dike
Otu nwaokorọbịa bụ Mamoudu Gassama nwafọ mba Mali abụrụla onye eturu dike na mba Fransị mgbe ọ zọpụtara otu nwatakịrị chọrọ isi n'elu ụlọelu daa
Onyeisiala mba Fransi bụ Emmanuel Macron kwere nkwa inye ya akwụkwọ ịbụ nwafọ mba Fransị.
N'egwuregwu;
Otu onye nkwado Mohamed Salah ederela FIFA na UEFA akwụkwọ ka ha taa Sergio Ramos ahụhụ kwuo na aka ya dị mmerụ ahụ Salah nwere, ọtụtụ puku ndị ọzọ etinyela aka n'akwụkwọ ahụ.
Salah n'onwe ya ekwuola na ọ ga-eso ndị Egypt agba asọmpi iko mba ụwa.
Gere akụkọ mere n'utụtụ a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa: