Onye Mali rigoro ụlọelu ịzọ nwata abụrụla onye France

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Otu onye Mali gbagara ọsọ ndụ na France abụrụla onye a na-akpọ dike maka etu o siri gba mbọ zọpụta nwata dị afọ anọ chọbụrụ ị dapụ n'elu ụlọelu.

N'otu aka ahụ kwa, onyeisiala France bụ Emmanuel Macron emela nwoke ahụ a kpọrọ Mamoudu Gassama onye France, ma nye ya akwụkwọ ikike.

Mamoudou Gassama nwetara ekele nke ukwuu etu o siri ria ilu uloelu ahụ ga zopụta nwata ahu chọrọ ị dapụ.

Onyonmyo siri France gosiri ebe ọ na arị ụlọ elu ahụ nakwa ndị mmadụ na-eti mkpu ha ji agba ya ume.

Ka onyeisiala Emmanuel Macron zutere ya n'obi ukwu ndị France akpọrọ Elysee Palace, okwuru na Gassam ga abụrụzi onye France.

Ọ gakwara n'ihu nye Gassama ezigbo ekele, ma nye ya ọlaedo ma kwukwa na a ga enye ya ọrụ n'ụlọ ịgbanyụ ọkụ.

Oku mberede a Gassama zara mere n'isi obodo France bụ Paris, n'ehihe ụbọchị 27 ọnwa a bụ Mee.

Maazi Gassama kwuru na ọ na-agafe were hụ ndị mmadụ gbakọrọ n'ihu ụlọ ahụ.

"Ka m kutere nwa ahụ n'aka m, ajụrụ m ya ihe mere o jiri me ihe a omere, mana ọ zaghị m," Gassama kwuru.

Ndị ọlụ mgbanyụ ọkụ Paris kwuru na mgbe ha rụrụ ebeahụ, ha hụrụ na a zọpụtara onye nọ na nsogbu.

Akụkọ Maazị Gassama dị ka ihe onye Mali ọzọ a kpọrọ Lassana Bathily mere n'afọ 2015 mgbe ndị oyi egwu wakporo ebe a na-ere nrị.

Maazi Bathily nyere mmadụ isii aka di ka ọ kpọrọ ha gaa ebe ha zoro ma rịpụ ga kpọ ndị uweojii.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: