You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndị ọchịehi awakpola Akure South
Akụkọ na-apụta n'ekwu na ndị ọchi ehi awakpola obodo dị na Akure South na Ondo Steeti.
Onye n'ekwuchite ọnụ ndị ụweoji na Ondo steeti bụ Femi Joseph kọwara BBC na ihe nke a mere eme mana amabeghị ọnụọgụgụ ndị merụrụ ahụ maọbụ nwụọ anwụ.
Joseph sị ịhe mere bụ na otu onye ọrụ ugbo nọ n'egbochi onye ọchịehi ị gafe n'ebe ubi ya nọ, ka ha na-akpa isi ụka, ndị mmadụ agbakọ n'ene ịhe na-aga.
Nke a mere n'ebe a na-akpọ Futa North gate dị n'azụ ụlọọrụ ndị lokal gọọmentị n'ebe ahụ.
Anwụchịri mmadụ abụọ ahụ n'ụlọ mkpọrọ ma o nweghị onye nwụrụ anwụ n'okwu nke a.