You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Women Health: Ọrịa isii kacha emetụta ụmụnwaanyị karịa ụmụnwoke
- Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Etu nnukwu ndịiche si dị n'etiti nnukwu 'B' na ọkpa ehi zọrọ n'ala, otu a kwa ka nnukwu ndịiche si dị n'ahụ nwaanyị na nke nwoke.
Sayensị emeela na nwoke nwereike ịgbanwe onwe ya bụrụ nwaanyị, maọbụ nwaanyị agbanwee onwe ya bụrụ nwoke, mana ụbọchị awọ ga-amaba mmiri ọkụ, ka ọ ga-achọpụta na mmiri dị ụzọ abụọ.
N'ihi etu ahụ ha si dị, e nwere ọrịa bụ naanị ụmụnwaanyị na-arịa ya.
E nwekwara ụdịrị ọrịa na-aka apụta ihe n'ahụ ụmụnwaanyị karịa ahụ ụmụnwoke.
Ọ bụ ụfọdụ ọrịa dị etu a ka anyị chọrọ itule n'akụkọ a.
1. Osteoarthritis (Agba Ikpere)
Ọrịa ọbụla na-emetụta njikọ ọkpụkpụ mmadụ ka a na-akpọ "arthritis".
Mana nke a bụ Osteoarthritis na-akacha emetụta ụmụnwaanyị karịa ụmụ nwoke.
Enyochapụtabeghị ihe kpatara nke a.
Ọrịa Osteoarthritis na-emetụta ọkpụkpụ azụ (spine), ọkpụkpụ ukwu (hip), ikpere, nakwa njibi ụkwụ (ankle).
Ihe na-akpata Osteoarthritis bụ mgbe ihe na-ejikọ ọkpụkpụ bụ 'cartilage' kwọchara, nke ga-eme ka ọkpụkpụ abụọ na-echikọta ọnụ.
Oke ibu, nka nakwa ọrịa ọkpụkpụ bụ ihe ndị nwere ike ịkpata ọrịa a.
2. Lupus
"Lupus" bụ otu n'ime ọrịa nke bekee kpọrọ "autoimmune diseases".
E nwere ihe ndị dị n'ime ahụ mmadụ nke na-enye aka iji gbochie ọrịa, mana mgbe ụfọdụ, ihe ndị ahụ na-egbochi ọrịa nwekwara ike tụgharịa malite ibuso ahụ mmadụ agha.
Ọ bụ mgbe ihe dị otu a mere ka a na-ekwu na mmadụ nwere 'autoimmune disease.
Otu ọgwụ nke ndị ọkachamara kwuru na ọ na-enye aka maka ọrịa 'Lupus' bụ nke a kpọrọ 'hydroxychloroquine'.
3. Goiter
Goiter bụ ọrịa na-eme ka akpịrị mmadu zaa azaa.
Ihe na-akpata ya bụ mgbe akụkụ ahụ a kpọrọ 'Thyroid' anaghị arụcha ọrụ nke ọma.
'Thyroid' bụ obere akụkụ ahụ mmadụ a na-ahụ na mgbadata eko akpịrị (adam's apple).
Ọ na-ewepụta 'hormone' dị icheiche nke abụọ n'ime ha bụ 'thyroxine' na 'triiodothyronine'.
Ọ bụrụ na 'hormones' ndị a apụtaghị etu o kwesịrị, ọ ga-eme ka 'Thyroid' malite ibu ibu.
Nke a ka a na-akpọ 'goiter'.
Oge ụfọdụ kwa, ihe na-akpata 'goiter' bụ mgbe 'iodine' kọrọ mmadụ n'ahụ.
Ọrịa 'goiter' ka emetụta ụmụnwaanyị ọkachasị ndị gbarala afọ 40 maọbụ karịa.
4. Dayabitis ụdị nke mbụ (Type one diabetes)
Dịka onye ọbụla ma, dayabitis bụ ọrịa nke na-eme ka shuga karịa n'ọbara mmadụ.
Ahụ mmadụ na-emepụta ihe a kpọrọ 'insulin' nke na-enye aka ịgbari shuga dị mmadụ n'ahụ.
Ọ bụrụ na ahụ mmadụ enweghị ike imepụta 'insulin', ọ bụ ya na-akpata dayabitis ụdị nke mbụ maọbụ 'type one diabetes' na bekee.
Ụdị dayabitis a na-eme ma ụmụnwoke ma ụmụnwaanyị, mana nnyocha gosiri na ọ ka egbu ụmụnwaanyị karịa ụmụnwoke.
5. Ọrịa akpụ ara (Breast Cancer)
Ọnụọgụgụ ndị nwere ọrịa 'breast cancer' n'ụwa niile karịrị n'ụmụnwaanyị karịa ụmụnwoke.
N'ime ndị niile nwere ọrịa a, naanị otu pasentị bụ ụmụnwoke.
Amachabeghị kpọmkwem ihe na-akpata ọrịa 'breast cancer' mana ihe ndị ọkachamara chọpụtara bụ:
- O nwere ike isi na nne feere nwa
- Nwaanyị malitere ịhụ nsọ ya n'oge nwere ike inwe ọrịa a
- Nwaanyị nsọ ya kwụsịrị ịgba n'oge bụ nke a kpọrọ 'menopause' nwere ike inweta ya
- Oke ibu nwere ike ịkpata ya
- Nwaanyị atụbeghị ime mbụ, dịrị gawazie
6. Cervical Cancer
Ihe na-akpata ọrịa 'cervical cancer' bụ nje a kpọrọ 'human papillomavirus' maọbụ HPV n'aha ịchafụ.
Ọ bụ ụmụnwaanyị ka ọrịa a kacha eme, mana nje HPV nwere ike ịkpata ọtụtụ ọrịa ndị ọzọ n'ahụ nwoke.
Ha gunyere kansa amụ nakwa kansa ike (penile cancer, anal cancer).