You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Death during sex: Ihe nwereike igbu nwoke n'elu nwaanyị
- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
A nọkata nọkata a nụ na nwoke nwụrụ n'elu nwaanyị maọbụ na nwaanyị nwụrụ n'okpuru nwoke, mana gịnị na-ebute ya?
Ụfọdụ na-anwụ site n'ume ngwụ, ụfọdụ na-anwụ site na nkubi ume, ụfọdụ na-anwụ site n'ụzọ ndị ọzọ dị iche iche.
Mana ndị ọkammụta sayensị emeela nnyocha ịchọpụta ihe ndị nwereike ibute ọnwụ mgbe nwoke na nwaanyị na-enwe mmekọrịta ahụ.
Dkt. Issa Dahabreh nke Tufts Medical Center dị n'obodo Boston, na mba Amerịka, mere nchọpụta na ụfọdụ ndị na-anwụ n'ihu ọrụ n'ihi obi nkoropu.
Ọ kọwara na ụfọdụ oge, mmekọrịta nwoke na nwaanyị na-adị ka mmegharị ahụ nke na-adị ka ahụ gị ọ na-arụsi ọrụ ike; nke a nwereike ime ka mmadụ nwee obi nkoropu ọkachasị ndị na-anaghị emegharịbu ahụ oge ọbụla.
Gịnị nwereike igbu gị n'elu nwaanyị?
1)Ịṅụ ọgwụ tupu ị rịa ya elu:
E nwere ọgwụ ndị a na-ere maka ụmụnwoke ịṅụ tupu e dina nwaanyị, otu n'ime ha bụ nke a na-akpọ Viagra.
Mana ebe ndị dọkịta na-ekwu na ọ bụ nwoke amụ ya anaghị ekelinwu kwesịrị ịṅụ ọgwụ a, ụfọdụ na-akachi ntị ṅụọ ya makana ha chọrọ ka o mee ka amụ ha kwụdosie ike oge ha na-arị nwaanyị elu.
Ọ na-abụzị nsogbu nye ụfọdụ ụmụnwoke ọkachasị ndị nwere ọrịa obi (ụfọdụ anaghị ama na ha nwere ọrịa obi), n'ihi na o nwereike ime ka ume ọsọ mewe ha mgbe ha nọ n'ihu ọrụ nke nwereike ibute ọnwụ.
Ndị dọkịta na-ekwu ka a ṅụọ naanị otu mkpụrụ kwa ụbọchị n'ime ihe ruru otu awa tupu ị gaa n'ihu ọrụ, mana ụfọdụ na-aṅụ ihe karịrị otu.
2)Ọrịa obi:
Dkt McGinger Ibeneme gwara BBC na n'ihi na mmekọrịta nwoke na nwaanyị dị ka ebe mmadụ na-emegharị ahụ ga-eme ka mmadụ na-eku ume ọsịsọ, na o nwereike itinye onye nwere ọrịa obi na nsogbu.
O kwuru na onye okporo obi esighi ike nke bụ 'weak artery' na Bekee, na ọbara nwereike gbaruosie ebe ahụ ike nke ga-eme ka nsogbu nwereike ibute ọnwụ dapụta.
O kwukwara na oke ọbara ịgbaju n'isi nke bụ 'cerebral haemorrhage' site n'ihe Bekee kpọrọ 'adrenaline rush' nwereike ibute nsogbu oge nwoke na nwaanyị na-enwe mmekọrịta.
Nke bụ na oke ọbara gbajuo, o nwereike ikpachi ebe ikuku ndụ si abata, ọ bụrụ na ikuku ndụ ezughi ọ bụzịkwa ọnwụ na-akụ aka n'ụzọ gị.
3) Mkpọnwụ ahụ:
Dkt Ibeneme kwuru na n'ihi etu mmekọrịta nwoke na nwaanyị si atọ, ụfọdụ oge onye nwere ọbara mgbali elu nwereike ịbanye na nsogbu.
Ndị ọkammụta kwuru na ọ rakwara ahụ ịhụ ebe mmadụ nwụrụ site na mkpọnwụ ahụ a, mana mmadụ nwereike inweta mkpọnwụ ahụ site na mmekọrịta.
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri a ga-amasị gị: