Benue Strange Disease: Ihe anyị ma maka ọrịa ọhurụ pụtara na Benue steeti

Onyeisi 'Nigeria Centre for Disease Control' (NCDC) bụ Chikwe Ihekweazu ekwuola na ụlọọrụ ha na-enyocha ọrịa amaghị aha ya nke gbugoro mmadụ iri na ise na Benue steeti.

Ihekweazu kwuru na ha na-agba mbọ ịhụ na ya bụ ọrịa efesasịghị n'ebe ndị ọzọ.

Lee ihe ndị anyị ma maka ya bụ ọrịa ọhụrụ

  • E si na mmiri ebute ya
  • Nchọpụta e mere n'ụlọ nnyocha ha gosiri na ọrịa ahụ abụghị Lassa Fever, Yellow fever maọbụ Ebola.
  • Ọrịa a efeela mmadụ otu narị na steeti ahụ.
  • E wegala mmiri ekutere maka nnyocha gawa ụlọọrụ na-ahụ maka mmiri na Naịjirịa maka nnyocha ọzọ.
  • Ọ ga-ewe ihe ruru awa iri anọ na asatọ iji chọpụta mpụatara ya bụ nnyocha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: