Sex Education: Lekwa ihe anọ ga-eme ka nwaanyị gbajọọ inwe mmekọ

Mmekọrịta nwoke na nwaanyị na-atọwa ntị ma ihe niile dabaa ọfụma.

Mana kedụ ihe ndị gbasara ahụike nwereike ime ka ya bụ nsori kụọ ingin tụmadi n'ebe ụmụnwaanyị nọ?

Dọkịta na-ahụ maka ihe gbasara ime ahụ nwoke na nwaanyị bụ Gabriel Ogah kwuru na nsori anaghị amasị ụmụnwaanyị sitere na pasenti iri atọ ruo pasenti iri ise.

Lekwa nsogbu anọ ọ gwara anyị nwereike ike ime ka nwaanyị gbajọ nsori.

1) Ndatu mmụọ

Dọkịta Ogah kwuru na ọtụtụ ihe dịka enweghị obi ụtọ maọbụ echiche gbasara ihe dị icheiche ọ na-agabiga nwere ike ime ka nwaanyị kwachapụ nsori.

Ihe ọdachị a gụnyere enweghị ego, ihe ndị na-amasị ya maọbụ ụfụ ahụ.

2) 'Hormonal Imbalance'

Nke a na-esite n'ọnọdụ ahụ. Dọkịta Ogah kwuru na ihe dịka nwaanyị na anaghị ahụzi nsọ ya ga na-enwe ntachị ọtụ maọbụ ọtụ kpọrọ nkụ nke ga-eme na onye nke ya kpọ oku maka nsori ọ gbajọ ya.

Dr Ọgah kwuru na ụmụagbọghọ nwere orịa n'ike, maọbụ ihe na-agbakasi ha ahụ dịka ọtụ basara abasa (wide vagina) nwere ike ha agaghị ekwe enye onye nke ha nsori.

3) Oria Ọtụ

Nwaanyị na-arịa ọria ọtụ ndị a agaghị ekwe nwoke rịbanye n'ọtụ ha.

Dọkita Ogah gụpụtara ọrịa ndị a dịka igba ọbara n'ọtụ, akpa mamịrị na-ehi ehi maọbụ akpa nwa si n'ike ayọpụta.

4) Ọrịa echiche

Nke a na-atọ ọchị mana nwanne eziokwu dị n'ime ya.

Dọkịta Ogah kwuru na nwaanyị di ya ji ezigbo ego anaghị eche ka arịọ ya maka nsori mana nwaanyi na-eche maka ego o ga-eji gbo mkpa dị iche iche na-akpa ya ga gba ọsọ nsorị.

O kwukwara na nwaanyị nwere echiche maka ụfụ nsori na-enye ya maka ọtụ ya tachiri atachị agaghị emepe ụkwụ ya mgbe ọbụla onye nke ya chọrọ isuturu ya.

Ọnọdụ ndị a abụghị ebe ụwa jedebere makana ọgwụgwọ dị.

Dọkịta Ogah kwuru na ọgwụgwọ nke mbụ bụ ị ga-ahụ dọkịta ma anya ọria nke na-arịa onye.

Nke abụọ bụrụ ọgwụgwọ nwoke igbali rụta n'ọrụ ihe ndịa ahụ nwereike ime ka nwaanyị ya chekasịwa echịche ma o na-eri nsori.

N'okwu ya , ego di, ihe niile na ga siriri werere, nwoke na nwaanyị ga-an apia ọkụ mgbe ọbụla mana ọ bụrụ na ihe ndịa adịghị, ihe nsori ga-adị ha ka akụkọ Mike Ejeagha.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị: