Menstruation Disorder: PCOS, Adenomyosis, na ọrịa ndị ọzọ na-emetụta nsọ nwaanyị

    • Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo

Nwaanyị ọbụla ahụ zuru oke kwesịrị ị na-ahụ nsọ ya kwa ọnwa ọbụla.

Oge nwaanyị anaghị ahụ nsọ ya bụ ma ọ dị ime maọbụ n'ihi nka.

Mana o nwere ọrịa nwere ike ịkpata ka nwaanyị ahụ dị mma ghara ịhụ nsọ ya oge o kwesịrị.

Ọrịa nwere ike ime ka nsọ nwaanyị ghara ịgba chaa chaa, maọbụ ịgbazu etu o kwesịrị, maọbụ gbakarịa etu o kwesịrị.

Ọrịa nwekwara ike ime ka ahụ ụfụ karịa akarị oge nwaanyị na-ahụ nsọ ya.

Lee ụfodụ ọrịa ndị ahụ:

PCOS

Nke a bụ nke bekee kpọrọ 'Polcystic ovary syndrome'.

Ndị ọkachamara kwuru na ọ bụ ọrịa a kacha akpata atụghị ime ụnụnwaanyị n'ụwa.

Ahụ nwaanyị nwere ọrịa a anaghị ewepụta akwanwa nke a kpọrọ 'ovary' oge o kwesịrị.

Ọ bụ ya kpatara na ha anaghị ahụ nsọ ha oge o kwesịrị, maọbụ hụ ya ntakịrị.

Oge ụfọdụ, nwaanyị nwere ọrịa a agaghị ahụ nsọ ya ihe karịrị ọnwa atọ, mana ọ dịghị ime.

Ihe ndị ọzọ na-egosi na mmadụ nwere ike inwe ọrịa bụ:

  • Ibu oke ibu
  • Nwaanyị inwe nnukwu ajị n'ahụ ya
  • Nwaanyị inwe ọya ntutu isi a kpọrọ 'dandruff'
  • Nwaanyị inwe ahụ mmanụ mmanụ, dịrị gawazie.

A chọpụtabeghi nke ọma ihe na-akpata ọrịa PCOS, mana nnyocha gosiri na ọ dịka ihe na-esi na nne efere na nwa.

Endometriosis na Adenomyosis

Ọrịa abụo a nwere ike ịkpata oke ahụ ụfụ ma nwaanyị na-ahụ nsọ ya.

Dịka Dọkịta Chioma Ofoekii si kọwaa, akpanwa nwaanyị nwere ụfọdụ ihe ndị na-agba ya ogige, bekee kpọrọ 'inner lining'.

Ihe ọbụla mere ka ihe ndị a gbara akpanwa ogige baa ebe ọzọ bụ ya na-akpata Endometriosis'

N'aka nke ọzọ, mgbe ihe ndị a gbara akpanwa ogige banyere n'anụ ahụ (muscle) jigidere akpanwa, ya ka a na-akpọ 'Adenomyosis'.

Ọrịa ụbụrụ

Dọkịta Ofoekii kwuru na o nwere ihe bekee kpọrọ 'glands' nke dị n'ime ụbụrụ mmadụ nke na-enyekwa aka maka mgbe nwaanyị kwesịrị ịhụ nsọ ya.

Abụọ n'ime ha bụ nke a kpọrọ 'Hypothalamus' na 'Pituatary glands' bụ nke na-ewepụta 'hormone' dị iche iche.

Ọ bụrụ na e nwee ọrịa ọbụla metụtara 'gland' ndị a n'ụbụrụ mmadụ, o nwere ike ịmetụtakwa nsọ nwaanyị.

Ọrịa Ogbeke (Fibroid)

Ọrịa ogbeke bụ ọrịa dị ka akpụ (cancer) mana ọbụghị ya, nke nwere ike ito n'ime afọ nwaanyị.

Ya bụ ọrịa nwere ike ime ka ọbara gbakarịa nwaanyị n'oge nsọ ya.

O nwekwara ike ịkpata ọbara ịgba nwaanyị n'oge ọnọghị na nsọ.

Ọrịa Shuga

Ụfọdụ nnyocha gosiri na nwaanyị anaghị ahụ nsọ ya dịka o kwesịrị nwere ike inwe ọrịa 'diabetes mellitus'.

Nchọpụta gosiri na pasentị 25 ruo 50 nke ụmụnwaanyị na-arịa 'diabetes' na-enwe nhiahụ na nsọ ha.

Hypothyrodism

'Thyroid' bụ obere akụkụ ahụ mmadụ a na-ahụ na mgbadata eko akpịrị (adam's apple).

Ọ na-ewepụtakwa 'hormone' na-enye aka ịhazi nsọ nwaanyị.

Ọ bụrụ na ọ karịa maọbụ ghara iru eru, ọ ga-eme ka nsọ nwaanyị gbaa nnukwu maọbụ gbaa ntakịrị.

Nke a nwekwara ike imetụta etu nwaanyị si atụrụ ime.

Ọrịa akpanwa

Nke a bụ nke bekee kpọrọ 'uterine abnormalities'.

O nwere ike bụrụ na akpanwa anọghị ebe o kwesịrị ịnọ, maọbụ na ọ haghị etu o kwesịrị ịha, maọbụ ihe ọbụla.

Ọrịa ọbụla metụtara akpanwa nwaanyị nwekwara ike ịmetụta etu nsọ nwaanyị si agba.

Ọrịa mmekọ nwoke na nwaanyị

Ndị ọkachamara kwukwara na ọrịa ọbụla a na-ebute site na mmekọ nwoke na nwaanyị nwekwara ike ịmetụta etu nwaanyị si ahụ nsọ ya.

Aha dị icheiche gbasara nsọ nwaanyị:

Amenorrhea - Nsọ nwaanyị agbaghị agba

Dysmenorrhoea - Nsọ ịfụ oke ụfụ

Menorrhagia/Hypermenorrhea - Nsọ ịgbafe oke ma gbakarịa ụbọchị ole o kwesịrị

Oligomenorrhea - Nsọ ịnọkari oge a tụrụ anya na ọ ga-abịa

Hypomenorrhea - Nsọ ịgba nwantịntị