Ihe ise ndị nwere ikpu kwesiri ịma

Enwere ọtụtụ ihe ndị na-abụghị eziokwu maka ikpu nwaanyị, na-efegharị n'elu soshal midia mana otu nwaanyị aha ya bụ dọkịta Jen Gunter na-agba mbọ ịmezi ya.

Gunter bụ dọkịta na-ahụ maka ụmụnwaanyị di ime na US na Canada katọrọ atụmaatụ kwuru na a ga-etinyenwu akwa n'ikpu maka ihazị nsọ nwaanyị maọbụ ijide ebe nwaanyi si anyụ mamịrị.

Gunter depụtara ụfọdụ ihe o chere ndị nwere ọtụ kwesiri ịma ka aghara ị lafu ha.

1. Chọpụta ndịche dị n'etiti ọtụ na ọnụ ọtụ

Gunter kwuru na ọtụ dị n'ime ahụ ebe nke na-emetụta akwa gị bụ nke a na-akpọ ọnụ ọtụ.

O kwuru na ọ dịmma ka ụmụnwaanyị nakwa ndị mmadị na-akpọ okwu aha karịa ma ị na-akpọ ọtụ aha nkwuchi.

Nke a ga-eme ka amara nke bụ nke ma ị ga ikpesara dọkịta nsogbu gbasara ya.

2. Ọtụ na-ehicha onwe ya

Gunter kwuru na ọ chọpụtara na ụmụnwaanyị na-eche karị na ị ga-eji ncha dị iche iche wee sapụ ọtụ gị mana o kwuru nkea abụghị eziokwu.

O kwuru na ọtụ bụ ime ụlọ na-ehicha onwe ya.

A ga-ejinwu mmiri wee sachapụ ọnụ ikpu.

3.Ọtụ nwaanyị dịka ogige flawa

Ọtụ nwere nje ndị dị mma n'ime ya maka ichekwa ya dịka Gunter si depụta.

O kwuru na ụmụ nwaanyị ekwesighị iji ihe e ji akpọ ihe nkụ abịa n'akụkụ ọtụ.

4. Aji ọtụ nwere uru ọ bara

Gunter kwuru na ọ chọpụtara na ụmụnwaanyị na-ejikarị agụba akpụchapụ aji niile dị n'ọtụ ha.

Nke a dị mma maka iwepụ igwu n'ọtụ mana o nwere ọgbata uhie so ya.

Ogbatauhie so ya gunyere nyewa ahụ nakwa nje ibanye n'ime ikpu.

5. Nka na-emetụta ọtụ

Ka nwaanyị mụchara nwa, kwụsị ihụ nsọ ya, ihe dị n'ahụ ya mere ka ọ mụnwoo nwa e belata.

Nke a na-emetụta ọtụ na ọnụ ọtụ site n'ime ka ọ kpọ nkụ ghara ị na-atọzi nwaanyị ụtọ.

Gụnter nyere ndụmọdụ ka ụmụ nwaanyị hurụ onwe n'ọnọdụ a gaa hụ dọkịta ka onye ga-enye ha mmanụ ga-eme ka ọtụ ha ghara ịkpọ nkụ.

"O dị mkpa ka ụmụnwaanyị mata ihe ndị a ka ha ghara ịta ahụhụ",

Akụkọ ndị ga-amasị gị