You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe ise ndị nwere ikpu kwesiri ịma
Enwere ọtụtụ ihe ndị na-abụghị eziokwu maka ikpu nwaanyị, na-efegharị n'elu soshal midia mana otu nwaanyị aha ya bụ dọkịta Jen Gunter na-agba mbọ ịmezi ya.
Gunter bụ dọkịta na-ahụ maka ụmụnwaanyị di ime na US na Canada katọrọ atụmaatụ kwuru na a ga-etinyenwu akwa n'ikpu maka ihazị nsọ nwaanyị maọbụ ijide ebe nwaanyi si anyụ mamịrị.
Gunter depụtara ụfọdụ ihe o chere ndị nwere ọtụ kwesiri ịma ka aghara ị lafu ha.
1. Chọpụta ndịche dị n'etiti ọtụ na ọnụ ọtụ
Gunter kwuru na ọtụ dị n'ime ahụ ebe nke na-emetụta akwa gị bụ nke a na-akpọ ọnụ ọtụ.
O kwuru na ọ dịmma ka ụmụnwaanyị nakwa ndị mmadị na-akpọ okwu aha karịa ma ị na-akpọ ọtụ aha nkwuchi.
Nke a ga-eme ka amara nke bụ nke ma ị ga ikpesara dọkịta nsogbu gbasara ya.
2. Ọtụ na-ehicha onwe ya
Gunter kwuru na ọ chọpụtara na ụmụnwaanyị na-eche karị na ị ga-eji ncha dị iche iche wee sapụ ọtụ gị mana o kwuru nkea abụghị eziokwu.
O kwuru na ọtụ bụ ime ụlọ na-ehicha onwe ya.
A ga-ejinwu mmiri wee sachapụ ọnụ ikpu.
3.Ọtụ nwaanyị dịka ogige flawa
Ọtụ nwere nje ndị dị mma n'ime ya maka ichekwa ya dịka Gunter si depụta.
O kwuru na ụmụ nwaanyị ekwesighị iji ihe e ji akpọ ihe nkụ abịa n'akụkụ ọtụ.
4. Aji ọtụ nwere uru ọ bara
Gunter kwuru na ọ chọpụtara na ụmụnwaanyị na-ejikarị agụba akpụchapụ aji niile dị n'ọtụ ha.
Nke a dị mma maka iwepụ igwu n'ọtụ mana o nwere ọgbata uhie so ya.
Ogbatauhie so ya gunyere nyewa ahụ nakwa nje ibanye n'ime ikpu.
5. Nka na-emetụta ọtụ
Ka nwaanyị mụchara nwa, kwụsị ihụ nsọ ya, ihe dị n'ahụ ya mere ka ọ mụnwoo nwa e belata.
Nke a na-emetụta ọtụ na ọnụ ọtụ site n'ime ka ọ kpọ nkụ ghara ị na-atọzi nwaanyị ụtọ.
Gụnter nyere ndụmọdụ ka ụmụ nwaanyị hurụ onwe n'ọnọdụ a gaa hụ dọkịta ka onye ga-enye ha mmanụ ga-eme ka ọtụ ha ghara ịkpọ nkụ.
"O dị mkpa ka ụmụnwaanyị mata ihe ndị a ka ha ghara ịta ahụhụ",