Baldness: Ihe na-akpata isi nkwọcha nakwa ihe ị ga-eme banyere ya

Isi nkwọcha

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Isi nkwọcha nwere ike ime ka obi daa ụfọdụ ndị ntorobịa mba

Eloka (nke a abụghị ezigbo aha ya) bụ nwaokorobịa gbara afọ iri abụọ na abụọ, mana ọ gbara ya gharịị na ọ malitela inwe isi nkwọcha.

Ihe a na-echu ya ụra oge niile, n'ihi na ndị enyị ya na-eji ya amanye ya njakịrị n'ụlọakwụkwọ maọbụ na nnọkọ ha ọbụla.

O kwuru sị: "Aghọtaghị m ụdị ihe a, gịnị kpatara ntutuisi m ji epewanye mpe? E che m na ọ bụ naanị ndị okenye na-enwe isi nkwọcha?"

Ndị ọkachamara kwuru na isi nkwọcha ụmụnwoke nwere ike ịmalite mgbe mmadụ ka na-etoputa, bụ nke bekee kpọrọ 'teenage years'.

Isi nkwọcha
Nkọwa foto, Ọ na-agba Eloka gharịị ihe kpatara o je enwe isi nkwọcha n'agbanyeghị na ọ ka bụ ntorobịa

Ụdị isi nkwọcha a ka Bekee na-akpọ 'male-pattern baldness".

Mana ya bụ ihe na-abvụkarị ndị topụtarala mmadụ ka ọ na eme, ma na-akawanye njọ dịka afọ mmadụ na-agbali.

Gịnị na-akpata isi nkwọcha?

Ezinụlọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọ bụrụ na nna maọbụ papa nnukwu mmadụ nwere isi nkwọcha, ohere onye ahụ inwekwa isi nkwọcha buru ibu

Dịka Dọkịta Francis Chika Ezegbe si gwa BBC na mkparịtaụka ekwentị, ihe nwere ike ịkpata isi nkwọcha abụghị otu ihe, mana nke kacha apụta ihe na-abụkarị ihe na-esi n'agbụrụ.

Ezegbe na arụ ọrụ dịbịa bekee n'ụlọ ọgwụ dị na mba UK

O kwuru sị: "Ọ bụrụ na isi nkwọcha dị n'agbụrụ mmadụ; ya bụ na nna maọbụ papa nnukwu maọbụ nwanne mmadụ nwere isi ya, ohere dị na onye ahụ ga-enwekwa isi nkwọcha."

Ihe ndị ọzọ nwekwara ike ikpata isi nkwọcha gụnyere:

Isi nkwọcha
Nkọwa foto, Ụfọdụ ka isi nkwọcha nke ha na-amalite n'ihu isi
  • Ọrịa - dịka ọrịa umeji (liver) maọbụ ọrịa ụfọdụ akpụkpọahụ
  • Mgbanwe n'ahụ - Ụfọdụ ụmụnwaanyị nwere ike malite inwe ndapụ ntutu ma ha dị ime maọbụ mụọ nwa, maọbụ ha ruwe mgbe ha ga-akwụsị ịtụ ime (menopause)
  • Ọgwụ mmadụ ṅụrụ aṅụ - ụfọdụ ọgwụ kansa, maọbụ nke ọbara mgbalielu nwere ike ịkpata ndapụ ntutu
  • Ọgwụgwọ nke Bekee kpọrọ 'radiation therapy'
  • Ndọkasị ahụ (stress)

Mana ihe na-akacha akpata isi nkwọcha na ndị ntorobịa na-abụkarị site n'agbụrụ.

Ụfọdụ ndị ọkachamara ekwuola na ntutu ọbụla dị mmadụ n'isi nwere ogo ndụ ya, nke pụtara na dịka oge na-aga, ntutu ahụ ga-eru n'isi njedebe ndụ ya ma kwụsị itopụta

Gịnị na-egbochi isi nkwọcha?

Mmanụ isi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọ dị ọtụtụ mmanụ nakwa ọgwụ dị n'ahịa iji gbochie ndapụ ntutu, mana ndị ọkacha mara kwuru na o nweghị nnyocha gosiri na ha na-arụ ọrụ

O nweghi ihe e kwekọrịtara kpọmkwem nwere ike igbochi isi nkwọcha, ọ kachasị ọ bụrụ onye o si n'agbụrụ ya.

Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ọgwụ a kpọrọ 'supplements' nakwa mmanụ dị icheiche juru ahịa ugbua, bụ nke ndị na-ere ha na-ekwu na ha nwere ike igbochi ndapụ ntutu ma mee ka ntutu na-etoli nke ọma.

Mana dịka Dkt Ezegbe si kwuo, o nweghị nnyocha ọbụla gosiri na e nwere ọgwụ na-egbochi isi nkwọcha.

"Ọ bụ eziokwu na e nwere ude maọbụ mmanụ nwere ike ime ka ntutu tolie nke ọma, mana ọ na-ete aka - ihe dịka ọtụtụ ọnwa - tupu ha arụọ ọrụ," Ezegbe kwuru.

Gịnị ka onye nwere isi nkwọcha ga-eme?

IK Ogbonna

Ebe foto si, Instagram/@ikogbonna

Nkọwa foto, Onye ejije Nollywood bụ IK Ogbonna nweburu isi nkwọcha, mana ọ na-etinye ntutu aka mere iji chọkwaa onwe ya mma ọzọ

Dịka dkt Ezegbe si kwuo, ọ baghị uru mmadụ ịdọgbu onwe ya n'ihi ihe ọ ma na ọ ga-emerịrị.

O kwuru sị: "O doro anya na dịka afọ mmadụ na-agbalite, ụfọdụ ihe dị n'ahụ mmadụ agaghịkwa na-arụ ọrụ etu ha si arụbu. Nke a abụghị ihe mmadụ ga-eji chegbuo onwe ya.

"Ọ dị mkpa ka mmadụ nwee ntụkwasị obi n'ime onwe ya nke Bekee kpọrọ 'self confidence'."

"Isi nkwọcha abụghị ọrịa, ya mere ejikwala aka gị gbuo onwe gị."

Mana o kwukwara na mmadụ nwere ike ịga ụlọọgwụ ga tinye ntutu n'isi ya bụ nke a kpọrọ 'hair transplant'.

'Hair transplant'

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, E nwere ụlọọgwụ dị icheiche na mba ofesi ebe e nwere ike itinyere mmadụ ntutu n'isi ya nke Bekee kpọrọ 'hair transpalnt'

"Otu onye agbatobi m na UK ebe a kwụrụ puku paund atọ (£3000) maka ịga ụlọọgwụ na mba Turkey maka 'hair transplant'," Ezegbe kwuru.

Puku paụnd atọ karịrị otu nde naịra (N1 million) na Naịjirịa.

Mana ọ bụrụ na ị chọọ ntutu aka mere, ha juru eju n'ahịa ugbu, ma nke nwoke ma nke nwaanyị.

Charles Okocha

Ebe foto si, Instagram/@charles_okocha

Akụkọ na-ekwu na ọtụtụ ndị a ma ama na Naịjirịa na-etinyezi ya bụ ntutu aka mere.

Ha gunyere ndị ejije Nollywood bụ IK Ogbonna na Charles Okocha, dịrị gawazie.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ọgba mbọ: M na-ahazibu egwu, mana ugbua mụ na ụmụ m na-emezi ụmụnwaanyị isi