Ụlọikpe agbapụtala ọkwọ ụgbọala nyara Anthony Joshua ma yigharịa ụbọchị ikpe ya

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụlọikpe dị n'Ogun steeti, Naịjirịa ehigharịala ikpe nwamadị Adeniyi Kayode nyara ụgbọala Lexus nke ukwuu nwere mkpọkasị n'okporoụzọ.

Kayode nyara ụgbọala kpọkasịrị magbuo mmadụ abụọ a ma dịka enyi ọkụọkpọọ Anthony Joshua.

Ihe mberede a mere n'ụbọchị 29 Dizemba 2025 n'ụzọ Shagamu dị n'Ogun steeti ma gbuo mmadụ abụọ a nakpọ Latif Ayodele bụ onye na-enye ọkụọkpọ Anthony Joshua ọzụzụ na Sina Ghami na-enye ya nchịkọta ikikere na ntụzịaka.

Maazị Kayode na ọkaiwu ya bụ Otunba Olalekan Abiodun gara n'ụlọikpe Majie dị na Shagamu n'Ogun steeti, n'ụbọchị Tuuzde 20 Janụwarị 2026.

Mana ọkaikpe yigharịrị ikpe ha gaa n'ụbọchị 25th Febụwarị dịka onye ikpe yọrọ ka e nyetụ ya oge o ga-eji anata ndụmọdụ ikpe n'aka ọkaikpe kachasị.

Onye ikpe tinyere ikpe anọ n'akwụkwọ maka maazị Adeniyi Kayode dị afọ 46.

Ike ahụ gụnyere ịkpata ọnwụ site n'ịnya ụgbọala n'ụzọ itinye ndị ọkwọ n'ụzọ ahụ n'ihe ize ndụ.

Ọzọ bụ ị nya ụgbọala n'enweghị uche na nke ize ndụ.

Ọzọ bụ ị nya ụgbọala na-enweghị nlekọta kwesịrị ekwesị, na ịnya ụgbọala na-enweghị akwụkwọ ikike kwesiri.

Ụlọikpe Majie nyere ya mgbapụta nde naịra ise (£2,600).

Mana, o zutere ọnọdụ mgbapụta ahụ ụlọikpe nyere ya nke mere e ji hapụ ya n'ụlọ mkpọrọ.