E weere ụmụ m n'ọrụ ịtụ mgbere mmadụ, ma esooro m ndị uweojii chọta ha

    • Onye dere ya, Saidu Bah
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Africa Eye
    • Ebeg o si, Makeni
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Foday Musa nọ ka onye ike ụwa gwụrụ dịka ọ na-ege ozi ikpeazụ nwa ya nwoke ziteere ya n'ekwentị.

Ọ dị ntabianya 76 mana nwata nwoke ahụ kwuru okwu ka onye ọ na-ewu ewu. Ọ na-ebe akwa, na-arịọ maka enyemaka nna ya.

"O siri ike ịnụ ihe dị etu ahụ. Ịnụ olu ya na-agbawa m obi," ka Musa gwara BBC Eye, onye ndị uweojii nyere ohere ịbata na ngalaba ụlọọrụ ha nyere aka n'ịchọ ụmụ ya ndị nwoke abụọ a ghọrịrị.

Ọ bụ na Febụwarị 2024 ka a kpọọrọ nwa Musa nke nwoke dị afọ 22 na nwa ya nwaanyị dị afọ 18 nakwa mmadụ ise ndị ọzọ site n'ime obodo ha dị na mpaghara Faranah, ma kwe ha nkwa inye ha ọrụ na ba ofesi.

Ọrụ ndị ahụ abịaghị na mmezu, dịka a chọpụtara na ndị kpọrọ onwe ha ndị na-enye ohere ọrụ bụ ndị na-atụ mgbere mmadụ. A kpọọrọ ha gafee n'okeala Sierra Leona ma kee ha agbụ.

"Obi m etiwaala. Agaghị m akwụsịnwu ibe akwa. Gi lee anya n'anya m, ị ga-ahụ ihe mgbu," ka Musa kwuru.

Ndị uweojii mbaụwa bụ Interpol dị na mba Guinea weere okwu ya, ma rịọ ngalaba ha nọ na Sierra Leone maka enyemaka. N'ọnwa Ọgọst gara aga, Musa mere njem gaa Makeni dị na mpaghara etiti mba Sierra Leone, dịka ọ na-agba mbọ ịchọta ha.

Ndị na-atụ mgbere mmadụ a maara nke ọma dịka QNET na-arata ọtụtụ ndị bi n'Afrịka.

Ọ bụ na Hong Kong ka ehiwere ya, mana QNET n'onwe ya bụ ezigbo ụlọọrụ na-ahụ maka nlekọta ahụike, ha na-anabata ka ndị mmadụ debanye aha iji zụta ha ngwaahịa ma ree ya n'ịntaneetị.

Ndị mmadụ akatọọla usoro azụmaahịa ha, mana ka o sina dị, otu ndị omekome ji aha ha eme ihe rụrụ arụ na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka.

Ndị a na-atụ mgbere mmadụ na-agakwuru ụmụ mmadụ ma kwe ha nkwa ohere ọrụ n'ebe ndị dịka Amerịka, Kanada, Dubaị na Yurop, ma gwa ha kwụọ akatamkpo ego maka usoro ndebanyeaha tupu ha amalite ọrụ.

Ha kwụchaa ụgwọ, a na-akpọrọ ha oge ụfọdụ gaa na mba ndị gbara agbataobi ma gwa ha na ha pụrụ ịga mba ofesi naanị ma ọ bụrụ na ha kpọbata ndị ọzọ.

Mana ha anaghị ahụ ọrụ ọbụla, ọbụladị mgbe ha kpọtara ndị enyi na ndị ezinaụlọ ha.

Musa na ndị ezinaụlọ ya enyelarị ndị ahụ na-atụ mgbere mmadụ $25,000 (£19,000), nke gụnyere ego ndebanyeaha na ego mgbakwunye ọ kwụrụ dịka ọ na-agba mbọ ịkpọlata ụmụ ya.

Mahmoud Conteh bụ Onyeisi nnyocha n'ụlọọrụ na-ebu agha megide ịtụ mgbere mmadụ n'ime ụlọọrụ ndị uweojii Sierra Leone kwuru na okwu a dị mkpa nye ngalaba ya.

"Ọ na-adịrị ndị a na-tụ mgbere mmadụ mfe isi n'otu okeala anyị banye na nke ọzọ site n'okpo ndị a iwu na-akwadoghị," ka ọ gwara BBC.

Oge Conteh nwetara ozi na e ji ọtụtụ ndị ntoroọbịa eji n'otu ogige dị na Makeni, Musa sonyere ndị uweojii oge ha wakporo ogige ahụ, dịka o nwere olileanya ịchọta ụmụ ya.

A hụrụ akpa na uwe ndị a tụrụ n'ala. E chere na mmadụ 10 ruo 15 na-arahụ n'otu ọnụụlọ.

Ndị uweojii Interpol kpọkọtara mmadụ niile nọ n'ime ụlọ ahụ ma chọpụta na ụfọdụ n'ime ha dị afọ 14.

"Ọtụtụ n'ime ha bụ ndị Guinea. Naanị otu onye Sierra Leone nọ n'etiti ha. Ndị ọzọ bụcha ndị Guinea," ka Conteh kwuru.

Ụmụ Musa esoghị n'ime ha, mana otu nwaokoroọbịa kwuru na ha nọ ebe ahụ n'izuụka gara aga.

A kpọgara ndị ntoroọbịa ahụ n'ụlọọrụ ndị uweojii maka ime ha nnyocha tupu a kpọlaa 19 n'ime ha n'ụlọ ha dị na mba Guinea.

Ndị uweojii sị na ha emeela mwakpo dị etu a ugboro 20 n'ime afọ gara aga, ma napụta ọtụtụ ndị a tọọrọ.

Ụfọdụ mgbe, a na-akpọga ndị ntoroọbịa ahụ mba ndị ọzọ, mana ndị ọzọ, dịka Aminata di afọ 23, nwaafọ mba Sierra Leone a gbanwere aha ya iji chekwaa ya, ka a na-ebugharị na mba ha.

Aminata gwara BBC etu enyi ya siri gosi ya ndị kwuru na ha bụ ndị nnọchiteanya QNET n'etiti afọ 2024.

O mere nke ọma oge a gbara ya ajụjụ, dịka ha gwara ya na ọ ga-aga ọzụzụ tupu akpọgaa ya mba Amerịka maka ịga n'ihu n'agụmaakwụkwọ nakwa ịrụ ọrụ.

Naanị ihe ọ ga-eme bụ ịkwụ $1,000 iji sonye n'ihe omume ahụ.

Ha megheriri ya anya ikweta na ọ bụ ihe ziri ezi, ezinaụlọ ya enye ya ego ahụ ha chekwara maka agụmaakwụkwọ koleeji ya.

"Na mmalite, ha ga-enye gị ihe oriri, ma lekọta gị anya nke ọma. Mana dịka oge na-aga, ha akwụsị," kamọ gwara BBC.

"Ị ga-ere ahụ gị ma gaa ka gị na ụmụnwoke nwee mmekọ iji kpata ego, ka i nweeike lekọta onwe gị anya."

Aminata kwuru na a gwara ya na ọ ga-akpọbata ndị ọzọ n'ihe omume ahụ ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịga mba ofesi.

Iji mee nke a, ndị na-azụ ahịa mmadụ ahụ nyere ya nọmba mba ofesi iji mee ka o yie ka ọ nọrọla na mba ofesi mgbe ọ kpọtụụrụ ha.

"Ha na-akpọga gị n'ọdọụgbọelu, ị ga-eyi uwe dị mma dịka ị chọrọ ịga njem. Ha ga-enye gị paspọtụ, nye gị akwụkwọ njem adịgboroja," ka ọ kọwara.

"Ha ga-ese foto nke ị ga-ezigaara ndị enyi na ndị ezinụlọ gị."

Aminata mere ka ndị enyi na ndị ikwu ya mmadụ isii sonye n'atụmatụ a, na-atụkwa anya na ọrụ ahụ ga-emezu na mba Amerịka. Mana o meghị.

"Obi gbawara m n'ihi na ha mefusịrị ego ha, ha tara ahụhụ n'ihi m."

E jidere ya n'ebe dị nso na Freetown, isi obodo Sierra Leone, ihe dịka otu afọ tupu o doo anya n'ọrụ ahụ agaghị abịa.

Mgbe Aminata na-enweghị ike ịkpọtara ndị ahụ onye ọzọ, o yiri ka a na-ewere ya dịka onye na-abaghịzi uru nye ndị na-azụ ahịa mmadụ - mgbe o kpebiri ịgbapụ, a kwụsịghị ya.

Ịlaghachi n'ụlọ mgbe ihe niile mechara, ọkachasị mgbe mmadụ niile chere na ọ bi na mba ofesi, siri ike.

"Ụjọ tụrụ m ịlaghachi n'ụlọ," ka o kwuru.

"Agwara m ndị enyi m na m gara mba ofesi. Agwara m ezinụlọ m otu ihe ahụ. Anọ m na-eche maka ego niile ha nyere m iji ruo ebe ahụ."

Enweghị ndekọ ọ bụla gbasara ọnụọgụgụ ndị ụdị aghụghọ ọrụ a metụtara mana enwere akụkọ na-efesa na mgbasa ozi n'ofe ndịda anyanwụ Afrịka gbasara ndị otu na-egwu ndị mmadụ kwenyere n'atụmatụ ọrụ ndị a si mba ọzọ bụ eziokwu, wayoo.

BBC sonyeere ndị uweojii n'ọtụtụ mwakpo n'ime ụbọchị atọ na Makeni wee zute ọtụtụ narị ndị ntoroọbịa e si mba dịka Burkina Faso, Guinea, Ivory Coast na Mali daba n'aka ndị na-eme mpụ ịzụ ahịa mmadụ na mpaghara ahụ.

Ndị uweojii kwuru na ha jidere mmadụ iri na abụọ a na-enyo enyo na ha na-azụ ahịa mmadụ.

Mana eziokwu bụ na e nwere naanị mmadụ ole na ole a maara ikpe nke ọma, maka ihi ndị ọchịchị na-anaghị enweta ego na mpaghara ahụ iji bụso ndị wayoo na-adụ ahịa mmadụ ọgụ.

Dịka ndekọ ngalaba gọọmenti mba Amerịka si kwuo, malite n'ọnwa Julaị 2022 - mgbe e tinyere iwu mgbochi ịzụ ahịa mmadụ na Sierra Leone – ruo n'Eprel 2025, naanị ikpe anọ ka a marala maka ịzụ ahịa mmadụ na mba ahụ.

Musa achọtaghị ụmụ ya, ọ nweghịkwa ihe ọzọ ọ ga-eme ma ọ bụghị ịlaghachi Guinea naanị ya na ngwụcha Septemba.

Conteh, onye si Interpol, gwara BBC na ndị na-azụ ahịa ahụ tọhapụrụ ụmụ Foday obere oge ka nke ahụ gasịrị.

BBC chọpụtara na ada Musa laghachiri Guinea, mana ọ laghachibeghị n'obodo ya – mana ọ chọghịkwa ka a gbaa ya ajụjụ ọnụ.

Ọ kpọtụbeghị nna ya, nke na-egosi ihere nke ọtụtụ n'ime ndị ahụ ihe a metụtara na-agabiga.

Amaghị ebe nwa nwoke Musa nọ. Ọ ka bụ ọnọdụ mwute nye nna ha.