Adult Bedwetting: Lee enyemaka maka ndị okenye na-aba mamịrị n'elu akwa

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Jessica Nwankwo
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, BBC Igbo, Lagos
Ịba mamịrị n'elu akwa bụ otu ọrịa ndị mmadụ na-eche ndị mmadụ ọ metụtara echiche dị ukwu.
Mana ihe ihere so ya anaghị ekwe ndị mmadụ pụta jụọ ase maọbụ nata ọgwụgwa maka ya.
Ihe ọzọ sokwa bụ maka etu e si ahụta ndị ọrịa a na-arịa n'obodo site n'ileda ha anya maọbụ ịkparị ha.
Anyị jụrụ otu dọkịnta aha ya bụ Henry Eze nke kọọrọ anyị ihe na-akpata ọrịa a, etụ ị ga-esi nyere onwe gị aka nakwa ihe ndị ịkwesighị ime.
Lee ihe ọ gwara anyị na mpe mpe ya.
Ihe ndị na-eme ka mmadụ baa onwe mamịrị n'akwa gụnyere ihe ndị a
Ọrịa akpa mamịrị

Ebe foto si, Getty Images
Ị ba mamịrị n'elu akwa nwereike ịbido site n'ọrịa akpọrọ "Uniary Tract Infection' maọbụ ọrịa ọbụla metụtara akpa mamịrị ọbụla.
O kwukwara na ọ na-arara ndị ahụ ahụ ị jidete mamịrị ha ma n'ehihie mgbe ha mụ anya.
Mmerụ ahụ n'ọkpụkpụ azụ
Ihe ọzọ na-ebute ya bụ mmerụ ahụ metụtara ọkpụkpụ azụ nke Bekee kpọrọ "Spine".
Nke so ya bụ ọrịa kansa si ebe ọzọ n'ahụ gbasaa rukwe n'ọkpụkpụ ahụ.
Mmegbu maọbụ mmerụ ahụ n'ụbụrụ isi

Ebe foto si, Getty Images
Ndị gabigara ahụhụ, mmegbu maọbụ ndị merụrụ ahụ n'uburu so agabiga ịnyụ mamịrị n'akwa.
Ọ na-emekarị mgbe ha banyere n'ọnọdụ Bekee kpọrọ "catatonic" nke pụtara na echiche ha ga-alaghachi dịka mgbe ha dị n'ụmụaka.
Ọ pụtara na ha ga na-aba mamịrị dịka ụmụaka.
Ndị na-aṅụ ọgwụ ike na mmanya ike

O kwuru na ndị okenye na-aṅụ ọgwụ ike nwereike ị na-aba mamịrị n'akwa maọbụrụ na ha ṅụchaa ya bụ ọgwụ
O kwukwara na ndị na-aṅụ mmanya ọkụ nwereike ịba mamịrị n'elu akwa maọbụrụ na ha akpachaghị anya.
Ihe ndị ịkwesighị ime ndị na-agabiga ihe a

Ebe foto si, Getty Images
- Akwụsịla ha ịṅụ mmiri n'ihi na ịchọrọ ịbelata mamịrị n'akwa kama ṅụọ mmiri ịkwesiri n'ụtụtụ nakwa ehihie
- Mamịrị na-akpa ha, ha nyụọ ya ozugbo ozugbo kama ijide ya.
- Akpọla ha aha ọjọọ maọbụ tie ha ihe iji mee ka ha kwụsị ya.
Eze kọwara na ịnye ndị a nkwado ga-enyere ha aka nwee obi siri ike na ha ga-akwụsịnwu ya bụ ihe.
Etu ị ga-esi nyere onwe gị aka

Ihe mbụ Dọkịnta Eze kwuru bụ ka onye ọbụla ihe a na-eme gaa hụ dọkịnta ha n'ihi na o nweghi ihere dị na ya.
Ihe ọzọ ịnwereike ịme bụ
- Nyụọ mamịrị tupu ị rahụ ụra.
- Gbanye oku ncheta n'ekwentị gị ga-akpote gị kwa elekere atọ ka ịnyụọ mamịrị
- Aṅụla mmanya ike na mmanya nwere 'caffeine' n'ihi ha nwere ihe bụ "diuretics" na-eme ka mamịrị kpaa mmadụ mgbe niile.
































