Imo State Politics: Ihe Uche Nwosu kwuru maka ebubo ohi na ọchịchọ Biafra

Ebe foto si, Uche Nwosu Facebook
Uche Nwosu bụ onye ji ọkọlọtọ Action Alliance zọọ ọkwa gọvanọ n'Imo steeti ekwuola na ọ dịmma ka e were nwayọ na-achọ nwereonwe ndị Igbo.
O kwuru na iji ekworo na ọgụ agaghị e mee ka ndị Igbo nweta Biafra.
Nwosu onye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere si na ihe kacha mkpa ugbua bụ i bi n'udo ka ụmụnne.
Mgbe ndị nso nso BBC news Igbo jụrụ ya maka ego ndị Imo ya na nna ya ukwu Rochas Okorocha buru gbalaga, o kwuru na ọ bụghị eziokwu kama na ọ bụ kepu kepu ndị mmadụ na-ebugharị.
O kwuru na ihe Okorocha ji ego Imo rụpụta bụ ihe eji anya ahụ.
Mgbe ha jụrụ ya maka ala ọ nara ụfọdụ ndị mmadụ n'Imo, o kwuru ka atụọrọ ya aka otu ala ọ nara ndị mmadụ mgbe ọ nọ n'ọchịchị Okorocha.
Nwosu ọ ga-azọ oche ọchịchị n'afọ 2023?
Ọ zara si na o nweghị ebumnobi ugbua gbasara ọchịchị n'ọdịnihu makana ọ maghị ihe echi ga-amụta.
N'okwu ya, "ihe ka mụ mkpa ugbua bụ inye ndị na-achị ugbua nkwado ma ịzọ ndụ m maka coronavirus makana ọ bụ onye dị ndụ na-ekwu okwu ọchịchị".
I burukwanụ gọvanọ Imo steeti echi?
Nwosu kwuru na ọ ga-akpa ndị Imo obi anụrị site n'ime ka tụmadị ndị ntorobia nwe ezigbo ọrụ aka nakwa ime ka ndị mmadụ gụọ akwụkwọ n'efu.
Ebubo inye ndị Fulani ala n'Imo steeti?
O kwuru na ọ na-anụ ka ndị mmadụ na-ekwu na ndị Fulani na-abata n'ala Imo mana ọ chọrọ ka ndị Imo jiri nwayọ na-ebugharị akụkọ ụgha maka inye ndị Fulani ala.
Nwosu kwuru ka ndị mmadụ chetakwa na ndị Igbo bi n'ugwu awụsa na-egoro ala n'aka ndị ugwu na-arụ ụlọ ebe ahụ.
O kwuru na ndị Fulani anaghị azụ ala kama ha chiri anụmana ha richa nri otu ebe, ha kpọrọ ha laghachi ebe ha si bia.
Gịnị mere Rochas arụghị ụzọ dị mma?
O kwuru na Okorocha rụrụ ụzọ dị mma mana ụfọdụ oge a rụcha ụzọ o mebie, arụgharịa ya.
Ndị nso nso bokwara ya ebubo na ya na nna ya ukwu etinyeghị akụrụngwa n'ụlọgwụ ha rụgasiri.
O kwuru na ụfọdụ ụlọọgwụ Okorocha rụrụ abụghị iwu na ọ bụ ọchịchị ya ka a ga-etinye akụrụngwa n'ime ya kama ebe ọ kwụsịrị gọvanọ ọzọ bataranụ agawa n'ihu.
Ebubo akwụghị ụgwọ ezumike nka
Nwosu kwuru na mgbe Rochas Okorocha batara ọchịchị n'afọ 2011, na ọ kwụrụ ụgwọ ezumike nka eji ndị ọrụ ruo afọ iri na ise.
O kwuru na mpu socha we mee ka ụfọdụ ndị eji ụgwọ ghara inweta ego ha.
N'okwu ya, ya mere na ndị a na-ewetabeghị ego ha ga na-etisi mkpu ike ka a ga-asị na o nweghị onye a kwụrụ ụgwọ n'ọchịchị nke Rochas Okorocha.










