Nekede Students' Protest: Ndị EFCC, SARS na-emekpa anyị ahụ

Ebe foto si, fedpolynekede.edu.ng
Ụmụakwụkwọ nke ụlọakwụkwọ Politekiniki dị na Nekede, n'Imo steeti, na-ewe iwe maka oke mmekpa ahụ nke ha sị na ndị ọrụ nchekwa na-emekpa ha.
Iwe ha gbajuru n'ọnụ n'ụbọchị Fraịdee nke mere ka ha were okwute chụọ ndị ọrụ nchekwa ọsọ ụkwụ eru ala na ụlọakwụkwọ ahụ.
Otu nwata akwụkwọ na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ọ bụ ndị SARS bịara ịkpụrụ ụfọdụ ụmụakwụkwọ.
SARS bụ ngalaba ndị uweojii a kpọrọ 'Special Anti-Robbery Squad' na Bekee.
Nwaakwụkwọ a kwuru na ugboro ugboro ka ndị ọrụ nchekwa dị icheiche na-abịa eyi ụmụakwụkwọ egwu.
O kwuru sị: "Abalị abụọ gara aga, ọ bụ ndị EFCC bịara kpụrụ ụmụakwụkwọ karịrị iri ise."
"Ụnyaahụ bụ ndị SARS. Ha anaghị ekwe anyị ṅụrụ mmiri tọgbọ iko."
EFCC bụ ngalaba na-ahụ maka mgbochi nrụrụaka nke pụtara 'Economic and Financial Crimes Commission' na bekee.
Gịnị na-ese?

Ebe foto si, Twitter/OfficialEFCC
Dịka nwaakwụkwọ ahụ si kwuo, ndị ọrụ nchekwa na-ebo ụmụakwụkwọ ebubo na ha bụ ndị ohi maọbụ ndị ji igwe kọmputa aghọgbu ndị mmadụ nke bekee kpọrọ 'internet fraudsters'.
Mana ọ kọwara na mwakpo a akarịala nke na ha agaghịzi edinwu ya.
"Mgbe ụfọdụ, mmadụ ga-anọ n'ime ụlọ ya, ndị EFCC maọbụ SARS etiwaa ụzọ, kpụrụ onye ukwu na onye nta,"
"Ha hụ na i nwere kọmputa maọbụ 'I-Phone', ha ebo gi na ị bụ onye 'yahoo yahoo', kpụrụ gị."
"Ụfọdụ ụmụakwụkwọ na-eji ego buru ibu agbapụta onwe ha ma a kpụrụ ha."

"Iwe anyị bụ na ndịisi ụlọakwụkwọ anyị anaghị eme ihe ọbụla iji kwụsị ụdị mmekpa ahụ a."
Nwata akwụkwọ a anyị gbara ajụjụ ọnụ kwuru na ha na-ele ule ugbua.
Nke pụtara na ọtụtụ ndị SARS kpụụrụ ụnyaahụ agaghịzi eso lee ule.
Ihe ndị nchekwa kwuru

Ebe foto si, Twitter/@EFCC
Chris Oluka bụ onyeisi ngalaba mgbasa ozi na ụlọọrụ EFCC dị n'Enugu.
Ọ bụ ụlọọrụ a na-elekọta ụlọọrụ EFCC niile dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.
Ọ kọwara na ọbụ ọrụ iwu nyere ha ka ha na-arụ dịka ndị na-egbochi nrụrụaka.
O kwuru na "ihe gbasara mpụ ịntanetị ka njọ n'etiti ndị ntorobịa nọ n'ụlọakwụkwọ nakwa ndị ka guchara ọhụrụ."

Ebe foto si, Nigeria Police Force/Twitter
Mana Oluka kwuru na ha na-ajụ ese nke ọma tupu ha agaa ịkpụrụ mmadụ.
Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọ pụtaghị na ikpe mara onye ọbụla ha kpụụrụ.
"Anyị na-enyocha nke ọma ma tọhapụ ndị aka ha dị ọcha.
N'otu aka ahụ kwa, Orlando Ikeoku, bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo State sị na ya anụbeghị maka ngagharịiwe ụmụakwụkwọ Nekede mere na Fraịde.
O kwuru na ọ ga-ezighachiri anyị ozi ma ya nweta ya bụ akụkọ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:











