Igbo Ancient Warrior Tribes : Mba abụọ kpara ike mgbe ochie

"Nzọgbụ nzọgbụ enyimba enyi" . . . Nke a bụ egwụ ndị Igbo gburubguru ghọtara dị ka egwu eji akwado ime ihe siri ike.
Dị ka Igbo bụ ndị siri ike, mana enwere ufọdụ mba n'ala Igbo eji ihe ike mara.
Na agbanyeghi na enweghị mgbe ndị Igbo bịakọrọ ọnụ were lụọ agha, ndị Igbo lụritara ọgụ n'etiti onwe ha ma ha na ndị agbata obi ha lukwara ọgụ.
Gịnị na-akpata ọgụ n'ala Igbo mgbe ochie :
a) Izọọ ala okeala/ nsogbu okeala
b) Ahịa (ọ kachasị mgbere ohu)
ch) Ọgụ akwuru ugwọ
e) Amụma ndị nnanna
f) Iguzogide ndị ọcha.
Ugbua, ka anyị lee ufọdụ mba ikpara ike n'ala Igbo -
Umu Ekwumaenyi : Ezza, Ikwo na Izzii -

Ka ha siri Bido
Akụkọ mgbe ochie na akọwa na ọ bụ otu nwoke aha ya bụ Ekwumaenyi sịrị mba di anya were kwata Amuzu.
Akụkọ a kọrọ n'ọnu na-akọwa na Ekwumaenyi mutara Ezekuna, Noyo na Olodo.
Ezekunna mụtara Ezza, Noyo mutara Izzi ebe Olodo mụtara Ikwo.
Njiri mara :
A na-akpọkarị ha ndị 'ọgụ ukwu' n'ihi na ọgụ ha ji akọ ugbo sara mbara karia ogu ndị ọzọ n'ala Igbo.
Umu Ekwumaenyi bụ ndị eji ikọ ji mara. Ha siri ike ma dịka A. E, Afigbo dere n'akwụkwo ya bụ 'Ropes of Sand', ọ kọwara na ụmụ Ekwuymaenyi , ọkachasị Ezza bụ ndị eji ịkọpụta Ji were mara ma burukwa ndị ọkachamara n'ihe gbasara agha okpuru (gorilla warfare).
Ka ha sị gbasaa
Akụkọ ochie kwuru na Ekwumaenyi buru amuma na ụmụ ya ga-agbasa ruo mpaghara Cross River nke taa ma ruo kwa akụkụ mmiri Benue nke dị na Benue steeti nke taa.
Ohafia

Mgbe ochie n'ala Ohafia, nwoke tozuru etozu bụ onye gara agha ma gbụrụ isi mmadu lọta.
Onye lọtara ya bụ agha na apụta soro ibe ya gbaa egwu Ipirikpe ọgụ bụ egwu eji mara Ohafia rụo ubochị taa.
Ka ha siri bido
Akụko mgbe ochie a kọrọ n'ọnụ na-ekwu na ndị Ohafia si na Andoli were gbapụ ọsọ mgbe ha nuru mkpọtu dị ka ndị agha a na-achọ iwakpo ha.
Akụkọ a kwuru na nke a mere ka otu nwoke aha ya bụ Ezeama Atita na ụmụ ya nwoke abụọ bụ Uduma Ezeama na Onyereobi Ezema jiri zọpụ njem.
Onyereobi kwusiri na Abam n'ihi na nwunye ya dị ime ebe Ezeama Utita na Uduma gawara rute Ugwumgbo ebe ha kwusiri were biri.
Otu a ka ụmụ ha sịrị mubaa were nweta Ohafia.
Njirimara
Mgbe ochie, ndị Ohafia bụ ndị a ma ama n'ihe gbasara ilu agha na igbuisi.
Ndị agbata ha bụ Arochukwu na ndị mba ọzọ na akwụ ha ugwọ ka ha luchitere ha ọgụ.
Ihe a kacha jiri mara Ohafia ubochi taa bụ egwu Ikpirikpe ọgụ bụ egwu ha na-ete ma ha lọta agha iji gosi ndị nọ n'ụlọ ka ha sị mee n'ihu agha.
Lee ihe onyonyo a ka ihuta etu esi agba ikpirikpe ọgụ









