Lagos airport incident: FAAN enyopuola nwoke rịrị elu ụgbọelu

Nwoke magooro úgbúelú

Ebe foto si, NSTAGRAM / OTTO_ORONDAAM

Ndị ọrụ Federal Airports Authority of Nigeria (FAAN) akpọpụtala aha nwaamadị ahụ makwasara n'elu ụgbọelu na Murtala Muhammed International Airport dị na Legọs dịka Usman Adamu onye ha na-eche na o si mba Nije.

Onyeisi ụlọọrụ FAAN bụ Hamisu Yadudu kwuputara nke a mgbe ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu na Kanọ ụbọchị ụka.

Dịka otu onye bụ Otto Orondam so eme ya bụ njem n'ụgbọelụ ahụ kwuru sị na ya bụ ụgbọelụ amalitelarị ịpụ nwanyọ nwanyọ mgbe ya hụrụ otu nwoke bụ akpa ya sị n'ọhịa na-agbakwute ha.

Orondam sị na ozugbo onye na akwọ ya bụ ụgbọelụ hụrụ nwaamadị ahụ ka ọ na-abịa, o jiri nwayọ kwụsịnata were gbanyụọ njin ya.

Yadudu sị na ha enyefeelarị ya bụ nwoke n'aka ndị uweojii maka ịgba ya ajụjụ ọnụ.

Ọ kwetere na ihe niile pụtara na ya bụ ọgbatauhie dị FAAN n'isi ma kwukwe na gọọmentị enyela ndị ọrụ ngo ọrụ maka ịgba ya bụ ọdọụgbọelụ ogige.

FAAN kwukwara na ha achụọlarị ndị ọrụ nchekwa niile nọ n'ọrụ ụbọchị ihe ahụ mere.

Akụkọ ga-amasị gị

Aha onyonyo, Ihe nkiri na-egosi ọnụụzọ ụgbọala DANA fekapụrụ n'Abuja