Nigeria 's debt profile: Ibite ego abụghị ihe ọjọọ, kama...' Ọkachamara

Ebe foto si, Getty Images
Dịka okwu na-arị ibe ya elu gbasara ego Naịjirịa ji n'ụgwọ dịka ụlọọrụ Debt Management Office siri kwupụta, onye ọkachamara n'ihe gbasara akụnaụba bụ Bongo Adị, a kọwaala n'onweghi ihe dị njọ mmadụ maọbụ obodo ibite ego, kama na ọbụ ihe e jiri ya mee.
Na mkparịtaụta ya na BBC Igbo nwere, Adị kọwara ya dịka ihe mwute na ọchịchị gọọmentị dị icheiche na-ebite ego n'ebughi ụzọ mara ihe ha ga-eji ya mee, iji nyere ndụ ndị ha na-achị aka.
Ọ katọrọ atụmatụ ibiri ego na-etinyeghi ya n'ihe ga-eme ka ọmụbanye nakwa ikesara ndị mmadụ ego na-ahịa n'ụzọ i nyere ha aka dịka nke na-ekwesighi ekwesi.
O kwuru: ''I bite ego abụghị ihe ọjọọ, kama ọ bụ ebumnobi anyị. Ọ bụghị ihe ọjọọ ma anyị were ya nyere obodo anyị aka, ma kwalite ọnọdụ obibi ndụ ndị mmadụ''.

Ebe foto si, Getty Images
Adi, kwupụtara na ọbụrụ na e kesaa ego a dịka ọnụọgụgụ mmadụ nọ na Naijiria siri dị, na onye ọbụla nwere ike iketa ego buru ibu.
N'ihe Naịjirịa ga-eme wee kwụọ ụgwọ a, Adị tụpụtara na ọ bụrụ na Naịjirịa e nwee ndị ndu isi jụrụ oyi, ma bụrụkwa ndị ga-eleba anya n'ịkwalite akụrụngwa eji e nyere ndụ aka, ha ga-akwụpụcha ụgwọ a.
Ọ kwara arịrị na mbọ onye bụbu Mịnịsta Naịjirịa na-ahụ maka ego bụ Ngozi Okonjo-Iweala, iji hụ na mba ndị ọzọ kachapụrụ ego Naịjirịa ji a bụrụla nke kụrụ afọ n'ala n'ihi akatamkpo ego Naịjirịa ji ugbu a.
Cheta na ụlọọrụ na-ahụ maka ụgwọ bụ Debt Management Office, nọọrọ n'abalị anọ ọnwa Eprel kwupụta na Naịjirịa ka ọ dị ugbua ji ụgwọ ego ruru Tarị naịra iri na abụọ na ụma atọ (N24.387trillion).
Lee ihe ndị mmadụ n'ekwu na soshial media

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Akụkọ ga-amasị gị:









