Komla Dumor Award 2019: Nchọpụta kpakpando ọhụrụ na ntakụkọ Afrịka

Komla Dumor

BBC na-achọ onye ga-abụ kpakpando ọhụrụ n'ihe gbasara ntaakụkọ n'Afrịka maka nturuugo Komla Dumor nke BBC ụwa niile nọzi n'afọ ise ya.

Ndị ntaakụkọ na mpaghara Afrịka niile kwesiri ịtinye akwụkwọ maka nturugo a nke chọrọ ịchọpụta ọnatarachi ọhụrụ si Afrịka pụta.

Onye meriri ga-anọ ọnwa atọ n'isiụlọọrụ BBC n'obodo London na-amụta ọrụ aka na ahụmihe ọhụrụ.

Atụmatụ a ga-emechi n'ụbọchị 26 nke ọnwa Febụwarị afọ 2019 ebe elekere 23:59 n'oge ndị mba Briten (GMT).

E hibere nturugo a iji kwanyere Komla Dumor bụ onye ntaakụkọ mba Gana kajara akaja nke BBC ụwa niile ugwu dịka ọ nwụrụ n'ike n'afọ 2014 ọ dị afọ 41.

Ọ bụ n'obodo Legọs nke Naịjirịa ka esi amalite nturugo nke afọ a.

Presentational grey line
Presentational grey line

A ga-enye ya otu onye pụrụiche bi nakwa na-arụ ọrụ n'Afrịka, onye tinyere akọ na uche ntaakụkọ siri ike nakwa ọnatarachi pụrụiche n'ịkọwa akụkọ ndị Afrịka ma nwekwa ohere ịbụ kpakpando n'ọdịnịhu.

Gụnyere ị nọ na London, onye meriri ga-aga njem na Afrịka ị kọwa akụkọ - nke a ga-ekesa ebe ahụ nakwa n'ụwa niile.

Presentational grey line

Ndị meriri ochie:

  • 2015: Nancy Kacungira si mba Yuganda
  • 2016: Didi Akinyelure si mba Naịjirịa
  • 2017: Amina Yuguda si mba Naịjirịa
  • 2018: Waihiga Mwaura si mba Kenya
Presentational grey line

Onye ntaakụkọ mba Kenya Waihiga Mwaura ritere nke afọ gara aga ma si kwa na mba Togo zipụta akụkọ ya nke kachasị gbasara ụmụ ntorobia na-eji atịtị arụpụta prịnta nke 3D nakwa robotụ.

Waihiga kwuru na mgbe niile "ụdịrị obi Komla ji akọwa akụkọ ndị Afrịka" ga-emetụta gị.

Waihiga Mwaura quote: "Working with Komla’s friends and colleagues has helped me to continue Komla’s remarkable work"

"Mgbado anya o nwere n'ịgbanwe akụkọ Afrịka bụ otu n'ime ihe ndị mere ya ka ọ bụrụ ọpụrụiche n'ebe ndị ogbo ya ndị ntaakụkọ ndịọzọ nọ" bụ ihe onye meriri na 2018 kwuru

"Ọ dị m ka ọrụ a na BBC - ị so ndị otu Komla rụọ ọrụ - enyela m aka ị rụrụ gaaba n'akaọrụ ọma Komla bidoro. Olileanya m dị n'ụbọchị mgbe ndị ntaakụọ Afrịka dịka Komla ga-ebido kọba akụkọ ndị Afrịka n'ọkwa dị icheiche n'ụwa."

Aha onyonyo, Komla Dumor's former colleagues reflect on the late broadcaster's talent

Waihiga ga-eso n'emume mmalite nke afọ 2019 ebe ọ ga-anọ n'isi oche na nrụrịtaụka BBC ụwa niile gbasara ikike ndị ntorobia Naịjirịa na ntụliaka n'abịa.

Dịka a na-akwado nturugo a, Jamie Angus, onye na-achịkọta BBC n'ụwa niile kwuru:

"N'ọgbara ebe ọ dị mkpa ịgbasa ozi ziri ezi kwụ ọtọ, ọ dị mkpa na anyị lebara anya na ndị ntaakụkọ ma, ghọta ma hazie akụkọ Afrịka maka ụwa niile na-ege ntị ka anyị were gosi ndị mmadụ foto zuru ezu gbasara ihe na-eme na mpaghara Afrịka"

"Ndị niile meriri ochie egosila na ha bụ ndị ntaakụkọ pụrụiche, ma webata kwa ụzọ ọhụrụ a ga-eji chịkọọ ndị mmadụ na-ege anyị ntị"

"Ọ masịrị anyị ị ịkwalite ncheta Komla nakwa na-atụ anya ịchọpụta onye ntaakụkọ ọzọ kajara akaja n'Afrịka."

  • Ị chọọ ị ma ma ị tozuru nturugo a, pía ebe a
  • Ị nwekwara ike ịkesa akụkọ a n'elu soshal midia iji hashtag #BBCKomlaAward.