Ihe ise ị maghị maka 'Spiderman'

Ebe foto si, Getty Images
Ọ na amasị gị ikiri ihe onyonyo eserese 'Spiderman' mana ị maghị ka akụkọ ya bụ agwa siri bido?
Ụwa niile nọ n'iru ụjụ maka ọnwụ Stan Lee bụ One midoro agwa 'Spiderman.'
Lee so n'otu n'ime ndị bidoro 'Marvel Comics' bụ ụlọrụ na-eme ihe onyonyo nakwa akwụkwọ egwuregwu ụmụaka nke a kpọrọ comic books na bekee.
Ọrụ ndị ọzọ e ji mara Stan Lee gụnyere ihe nkiri eserese a kpọrọ Spiderman.
Dịka ụwa niile na-ebe anya mmmiri maka ode ihe ọchị a, lee ihe ndị i kwesiri ị ma maka nwoke a:
1. Ezigbo aha ya bụ Stanley Lieberman
Mana ọtụtụ mara ya dịka Stan Lee bụ aha ọ zawara n'ihi ihere ọ na-eme na-eme ya.
Ọ chọghị ka a mara na ya na-ede akụkọ ịkpa ọchị na 'Marvel Comics' ebe ibe ya na-aga ịgụ akwụkwọ maka ịbụ dịbịa bekee maọbụ ọkaiwu.
2. Ihe e jiri mara Lee

Ebe foto si, Getty Images
A mara Stan Lee maka ihe nkiri a ma ama dịka 'Spiderman', Iron Man, 'Avengers', Black Panther,'Captain America' ọkachasị ime agwa dịka 'Hulk', 'Spiderman' nakwa X-Men.
3. O bidoro n'ụtụtụ soro ebunuche ya n'iso akara aka ya
O bidoro ọrụ ide akụkọ eserese ụmụaka n'ụlọọrụ na nwata.
Ka o siri agba mbọ na ya mere ka e me ya onyeisi ndepụta akụkọ(Editor ) ihe eserese nke a kpọrọ 'cartoon'na bekee ka ọ gbara afọ 18.
4. Nwunye ya bụ Joan Lee nwụrụ n'afọ 2017

Ebe foto si, Alberto E. Rodriguez
Nwunye Lee bụ Joan nwuru n'afọ 2017.
Ihe e ji echeta Joan bụ nwafọ Briten bụ na ọ bụ alo ya tụnyere bunyere Stan Lee uche ị gaghachi n'ide akụkọ ọchị a kpọrọ 'Fantastic Four' nke wuru ewu n'afọ 1961.
5. Ọ bụ na okenye ya ka kpakpando Stan Lee chawara
Ọtụtụ amaghị na Stan Lee bụ nwa amụghị n'ime ego.

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụ ka ọ lachara ezumike nka ka o nwere aka nchawa mere ya oke mmadụ site na ide agwa mechara dọta nde kwuru nde dọla dịka ihe nkiri.
Iji maa atụ ihe nkiri 'Spiderman' nke pụtara n'afọ 2002 na nke so ya na 2004 nwetara ihe karịrị otu ijeri dọla( $1.6bn)
Ihe ụmụ ụwa na-ekwe maka Stan Lee na soshal midia
Stan Lee na-ewu na soshal midia kemgbe ọ nwụrụ.
Lee ihe ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu maka ya:
Emma Dilli kwuru na aga e ji ọrụ Lee echeta ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
@Blacktigerking678 kwuru na nagbanyeghị na ya ejighị anya ya hụ Stan Lee oge ọ dị ndụ, na ọrụ ya metutara ya n'obi.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Rahma Sadau kwuru na a gaghị echefu Stan Lee ụwatụụwa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Tunde Agboola kwuru na obi dị ya njọ maka ọnwụ Lee.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4









