Onye oziọma si US anwụọla naanị ụbọchị 12 ọ kwatachara Africa
Akụkọ dị mkpa taa:
Ogbugbu onye oziọma
Ndị omekome agbagbuola onye mba Amerịka na-ezisa oziọma n'obodo Bamenda dị na Kamerun.

Ebe foto si, BELIEVERS BAPTIST CHURCH
Mgbọ tụrụ Charles Wesco n'ime ụgbọala bu ya na nwunye ya aga ahịa ka ndị agha nchekwa na ndị agha ndị chọrọ inwere onwe ha nọ na-akwa mgbọ.
Ejidela ndị ntọ n'Imo steeti.
Aka akparala mmadụ ise a na-enyo maka ntọ ndị na-efe ala nna ha n'Imo steeti.
Godson Orlando Ikoku bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ gwara BBC na a hụrụ ihe mgba ama n'aka ha mere e ji nwụchie ha maka ịgba ha ajụjụ ọnụ.
Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Aka akparala ndị tọrọla ụmụ NYSC n'Imo
Na mba ofesi,
Nwatakịrị dị naanị afọ iri na asaa a kpọrọ Mikhail Zhlobitsky, ejirila ogbunigwe gbagbuo onwe ya n'ime ụlọọrụ ndị nchekwa n'obodo Arkhangelsk dị na mba Rọshịa.

Ebe foto si, Reuters
Mgbapụ ogbunigwe a merụrụ mmadụ atọ na-arụ n'ụlọọrụ ahụ ahụ ma mebikwaa ụfọdụ ihe.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Gianni Infantino bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ bụ FIFA kwuru na ha nwereike iwelite aka n'ọnụọgụgụ otu bọolụ ole ga na-esonye n'asọmpi Iko Mbaụwa site na mba iri atọ na abụọ ruo iri anọ na asatọ n'afọ 2022 kama 2026 a na-atụ anya ya.
Ndị Gọvanọ ekpebiela

Ebe foto si, Getty Images
Ndị gọvanọ Naịjirịa ekwuola na ọ bụ naịra puku iri abụọ hoohaa ka ha ga-akwụ n'ụgwọ opekatampe dịka ha na mịnịsta dị ịcheiche mechara nzụkọ ụnyaahụ n'Abuja.
Cheta na ngalaba na-ahụ maka ịkpuchi ndị ọrụ bụ NLC n'aha ịchafụ tinyere ụbọchị isii na Novemba iji mee aụbọ ọrụ ga-eme ka gọọmentị mezuo ụgwọ opekatampe naira puku iri atọ.

Ọzọ

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi ndịuweojii esila n'ọnụ onye na-ekwuchitere ha bụ Jimoh Moshood gwa steeti ndị gbara Abuja gburgburu ha kee nkwụcha.
O kwuru nke a dịka ha nwụchiri ndị ụka shiites ruru mmadụ narị anọ na-eme ngagharị iwe maka nwuchi onyeisi ha bụ Ibrahim El-Zakzaky kemgbe afọ 2015.
Na mba ofesi,

Ebe foto si, EPA
Ndị mmadụ emeela ngagharịwe na mba Amerịka mgbe onyeisiala ha bụ Donald Trump gara ịleta ebe anọ gbagbu ụfọdụ ndị na-ekpere ụka Juda na ngwụcha izuụka gara aga.
Mmadụ karịrị otu narị kwụchiri okporoụzọ na-egosi iwe ha dịka ebidoro ịli ụfọdụ ndị nwụrụ na ya bụ mwakpo.
N'Egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Otu Egwuregwu Leicester City ekwuola n'asọmpị dị n'etiti ha na otu Cardiff ga-aga n'ihu n'agbanyeghi ọnwụ onye nwe ha bụ Vikai Srivadhanapraba.
Mana ha ga-akawnayere ya ugwu otu nkeji tupu egbuo opi mbido asọmpị ahụ n'ụbọchị satọde.
Gee Nkeji nke ụtụtụ a
Ihe onyonyo nke taa












