Ganduje: EFCC agọọla na ahụbeghị ihe onyonyọ

Ebe foto si, @DrAUGanduje
Ngalaba na-ebu agha megide nrụrụaka bụ EFCC ekwuola na ha amaghị ihe ọbụla banyere onyonyo na-ebo Gọvanọ Umar Ganduje ebubo ịna ego ngarịị nke na-efegharị na soshal midia.
Kemgbe ụbọchịụka, ihe onyonyo gọsiri ebe Umar Ganduje bụ aka na-achị Kano steeti na-afọnye ego oyibo a na-ebo na ọ bụ ego akaazụ maka ọrụ ngo na steeti ahụ na babaringa ya na-ewu na soshal midia.
Ụlọọrụ akụkọ Daily Naijiria na-ebo Ganduje ebubbọ ịna ego ruru nde dọla ise.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ndị mmadụ na-atụ anya na dịka EFCC bụ ndị ọ dịrị inyocha ebubo nrụrụaka na ha ga-etinye ọnụ n'okwu ahụ akpụ n'ọnụ na sọcial midia.
Mana ọnụ na-ekwuru EFCC bụ Wilson Uwujaren gwara BBC na " Amaghị m maka ihe onyonyo ọbụla. Ahụbeghị m ya."
Ka ọ dị ugbua, Ganduje agọọla aka n'ụkwụ na ebubo ahụ sị na ihe onyonyo ahụ bụ 'arụrụ arụ' ma kwuo na ya ga-akpụpụ ndị ụlọakụkọ depụtara akụkọ ahụ n'ụlọikpe.
Akụkọ ndị ga-amasị gị
Mana Jafar Jafar bụ onye ntaakụkọ Daily Nigerian ndị wepụtara ihe onyonyo ahụ kwuru na ha kwụ ebe ha kwụ.
Jafar kwuru onye kwuru na ya ka nwere onyonyo 15 na-egosi Ganduje ebe ọ na-ana ego akaazụ kwuru na a na-ezitere ozi ịmaja ndụ ya.









