'EFCC agbapeela akpa ego Benue' - Terver Akase

Samuel Ortom

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Samuel Ortom: Otu Miyetti Allah bụ ndịkpatara oke ogbugbu mmadụ na Benue

Ọnụ na-ekwuru Saam Ortom, gọvanọ Benue steeti bụ Terver Akse gwara BBC na ngalaba na-ahụ maka nrụrụaka na mpụ na Naịjirịa bụ EFCC agbapeela ego steeti tinyere n'ụlọakụ.

Terver kwuru na kọmishọna na-ahụ maka ego gwara ya na EFCC wepụrụ mmachị a ha sị na ha tinyere abalị ole na ole gara aga.

Cheta na akụkọ pụtara na EFCC machiri steeti abụọ iwepụ ego n' aku ha nwere n'ụlọakụ, mana BBC eweteghị ihe akaebe na-akwado ya bu akụkọ.

BBC Igbo jụrụ Akase mgbe mgbachi a mere, o were kwuo na ọ bụ nwanne ụnyaahụ.

Ọ sara ajụjụ banyere etu ha siri mara maka mmachị a na ị sị na ọ bụ ndị ụlọọrụ ụlọ akụ gwara ya nke a.

O kwukwara na EFCC agwaghị ha ikike ha jiri tinye mmachị maọbụ nke ha jiri gbape ya.

"Ihe a mere gosiri udiri mpu gọọmentị etiti na-akwado"

Ọ rụtụrụ aka na ọ bụ maka gọvanọ Samuel Ortom hapụrụ APC gawa PDP ka ihe a ji eme na Benue.

BBC Igbo gbara mbọ ịnuta onu EFCC mana onye na-ekwuchite ọnụ ha bụ Wilson Uwujaren mana ekwenti ya agaghi.

Steeti ọzọ akụkọ kwuru na "mmachị" a metụtara bụ Akwa Ibom mana anyị enweteghị aka ebe maka nke a kwa.