Ipob: Tọpụnụ Nnamdị Kanụ na-egbughị oge

Nnamdị Kanụ

Otu Ipob akpọkuola ndị gọọmenti ka ha were ọsọ, were ije tọhapụ onyeisi ha bụ Nnamdị Kanu n'agbụ e kere ya kemgbe ndị agha Naịjiria wakporo ụlọ ya n'Afaraukwụ, n'Abia steeti n'ọnwa oktoba 2017.

Ipob kwuru na "eziokwu apụtala ife were gbaa kepụkepụ nịịle a na-anụ maka ebe Kanụ n'anwụ".

Ipob, na-akwụkwọ mgbasa ozi ha nke ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Emma Powerful zitere BBC kpọkuru ndị mba ụwa; United Nations, Britain, USA na ndị mba ọzọ mepere anya ka ha kpọkuo ndị Naịjirịa ka ha tọhapụ onyeisi ya ngwangwa.

N'okwu ya " onweghị iwu ndị na Naijiria, ECOWAS, AU maọbụ United Nations kwadoro ndị agha Naịjirịa ịkpara maọbụ ijide mmadụ ka ha si chọọ na-agbanyeghị iwụ obodo".

Ha sị na "mmaja a na-amaja ndị napụtara Nnamdi na-akaebe bụ ndị gọọment were wezuga uche ndị mmadụ na ọ bụ ha bụ oke tara azụ".

Nwaamadị bụbu Mịnịsta mgbasa ozi na gọọmenti Goodluck Jonathan bụ Femi Fani kayode ekwuola na Nnamdị Kanu nọ n'ime ụgbọmmiri ndị agha Naịjirịa nke dị na ikpere mmiri Bayelsa.

Kayode kwuru nke a n'akara twitter ya ebe okwuru na gọọmenti Buhari bu n'obi ịdowe ya ebe ahụ ruo mgbe emechara ntuliaka 2019.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ