D'banj ga-azara ọnụ ya n'ọnwụ nwa ya - Uweojii

Ebe foto si, Iambangalee/ Instagram
Na-erughị mkpụrụ ụbọchị abụọ nwa otiegwu bụ D'banj nwụrụ n'ime ọdọ mmiri dị n'ụlọ ya, ndị uweojii Naịjirịa akpọkuola ya ka ọ bịa zara ọnụ ya.
N'ime akwụkwọ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Legọs steeti bụ Chike Oti depụtara, o kwuru na ha zigara ndị ọrụ ha ka ha gaa mgbaru n'ụlọ D'banj dị n'Ikoyi, mana onweghị onye ha zutere n'ụlọ.
Oti kwuru na kọmishọna ndị uweojii bụ Edgal Imohimi, chọrọ ka D'banj na ezinaụlọ ya bịa mee mkpesa ihe mere nwa ha nwoke ma ha ruchaa uju.
N'akwụkwọ ozi ahụ, o dere "Kọmishọna ndị uweojii nke Legọs steeti bụ Edgal Imohimi, n'ikwuchitere ọnụ ndị uweojii ndị Legọs steeti, chọrọ ikasi ezinaụlọ Oladapo Daniel Oyebanjo a ma dịka D'banj obi, maka ọnwụ nwa ha nwoke bụ Daniel Oyebanjo nke nta, onye ihe mberede ya mere n'ụbọchị 24/06/2018, n'ụlọ ha n'Ikoyi-Legọs.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
"Kọmishọna chọrọ ka ezinaụlọ a mara na ndị uweojii sonyere ha n'oge iru uju a.
"N'agbanyeghị na ụlọọrụ anyị zigara ndị mmadụ nke CSP Mustapha N'Abba du, mgbaru n'ụlọ ezinaụlọ Oyebanjo n'Ikoyi ma onweghị onye ha zutere n'ụlọ ahụ, anyị na-atụ anya na oge iru ujuu ha gafechraa, ezinaụlọ a ga-abịa mee mkpesa ihe butere ọnwụ nwa ha nwoke bụ Daniel n'aka ndị uweojii.
Ka mkpụrụ obi ya zuru ike na ndokwa. Isee."

Akụkọ ndị ga-amasị gị:






