Ụgbọ oloko egbuola mmadụ atọ na London

Ebe foto si, PA
Mmadụ atọ nwụrụ tata ka ụgbọ oloko kwọrịrị ha n'ebe adịghị anya na ọdọ oloko nke London.
A na-eche na ndị a nwụrụ ga-adị afọ iri abụọ na mmanye. Ahụkwara okpokoro ihe eji agba "paint" na ngụ ozu ndị a nwụru.
Akpọrọ ndị uweojii na "Loughborough Junction", na gbụrụgbụrụ Brixton ka ọ na-akụ elekere 07:30 nke ụtụtụ tata.
Ndị ọrụ gbata gbata kwukwara na ha anwụọla mgbe ha ruru ebe ahụ.
Ndị uweojii na-enyocha ihe etu ndị nwụrụ siri ruo ebe ahu ha nọ nwụọ, ma na-ekwukwa na ha aghọtaghị ihe gbụru ha.

Supt Matt Allingham, bụ onye uweojii njem nke akpọrọ "British Transport Police" (BTP), kwuru na ahụ ndị a "dị ka ahụ ndị ọgbọ oloko kụrụ".
O kwuru na ọ bụ onye na-anya ụgbọ oloko ọzọ hụrụ ozu ụmụ nwoke ahụ were kpọ ndị uweojii. O kwukwara na "otela ndị ahụ nwụru tupu ahụ ha".
"Anyị ka na-achọ ịchọpụta ụgbọ oloko gbụrụ ndị a nwụrụ," Supt Allingham kwuru.
Ndị uweojii n=ka nọ ebe ahu ihe a mere na-acho ịchọpụta aha ndị nwụru ma gwa ndị nwe ha.































