Ụgbọ Oloko kopuru ma gbuo mmadu abuo na Milan nke mba Italy

Ebe foto si, EPA
Ụgbo oloko bu mmadụ kopuru n'okporo ya mgbe n'ụzọ Milan wee gbuo mmadụ abụọ ma merụọ mmadụ ruru otu narị ahụ.
Ndi na agbanyụ ọkụ na agba mbọ ịzọpụta ọtụtụ mmadụ tọọrọ na ime ụgbọ oloko ahụ.
Ihe mberede a mere na ụzọ ụlọ ụgbọ oloko dị na mpahara Italy na-akpọ Treviliglio na Pioltello, dịka ụlọ nta akụkọ Rai news kọwara.
Mmadụ iri merụrụ nnụkwụ ahụ ebe ndị mmadụ karịrị otu narị nọ na ụgbọ oloko a mgbe ihe a mere.
Ụgbọ Trenorda a si Cremona, nọ na ụgwụ Italy, na-aga Milan.
A mabeghị ihe kpatara ụgbọ a jiri kopu. Mkopu a mere na elekere asatọ nke ụtụtụ taa.


Ebe foto si, EPA





