Akụkọ kachasị n'abali a: Sineti ga-enyocha akụkọ onye nkuzi OAU

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:

Ụlọọrụ Sineti enwela mkpebi ọhụrụ

Ụlọọrụ ndị Sineti Naịjiria

Ebe foto si, @NGRSenate

Ụlọ omeiwu nta na Naịjirịa ekpebiela na ha ga-enyocha akụkọ mere n'etiti onye nkuzi na nwata akwụkwọ ọ chọrọ i dina.

Ihe a mere ka mahadum Obafemi Awolowo kwụsị onye nkuzi ahụ ọrụ n'ike.

Taa bụ oke ụbọchị nyere ndị mwereonwe Biafra

Emume ncheta Biafra

Ebe foto si, BBC Igbo

Nkọwa foto, N'Enugwu, Nnewi, Aba,Onitsha gbara chakoo taa dịka ndị mmadụ mere onyenọrọbeya maka ncheta Biafra

Aba, Enugwu, Nnewi na obodo ndị ọzọ gbaghara ahịa na ọrụ n'Igwe n'ụbọchị ncheta agha Biafra.

Mana Owere na umuahia biri ndụ ha ka o nweghị ihe na-eme.

Ebe ọzọ na Naịjirịa

Jolly Nyame

Ebe foto si, Jolly Nyame/Facebook

Akụkọ na-ekwu na a maala Jolly Nyame bụ Gọvanọ chiburu Taraba steeti ikpe mkpọrọ ihe ruru afọ ịrị n'anọ

Ụlọịkpe kwukwara na Nyame agaghị enweta ohere ida nha kama ị ga mkpọrọ.

Na mba ofesi

Arkady Babchenko

Ebe foto si, AFP

Arkady Babchenko bụ onye ntaakụkọ Rọshia e chere na ọ nwụrụ n'izuụka gara aga pụtara na nzụkọ ndị ntaakụkọ.

O kwuru na o mere emume ọnwụ a iji zọọ ndụ ya dịka o nwetere ozi n'ụlọọrụ a kpọrọ 'Kremlin' na-achọ igbu ya.

N'egwuregwu,

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari agwala otu 'Super Eagles' ka ha gbaa mbọ hụ na ha meriri asọmpị iko mba ụwa ha tozuru ịga

Ọ sị na olileanya nde nari iri naasatọ ndị Naịjirịa dị na ha.

Gee nkeji mgbede anyị ebe a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe onyonyo nke taa:

Aha onyonyo, Biafra: Gịnị nọ n'ime Bọnka Ojukwu