Ọbụ gini na-eme na registri Ikoyi

Ikoyi Marriage registry
Nkọwa foto, Ụfọdụ ọchịchị ime obodo chọrọ ka gọọmentị etiti sepụ aka na ịgba ndi mmadu akwụkwọ

Nchọpụta BBC mere na-egosi na akụko pụtara na ụlọikpe enyere iwu ga-akwụsị idebanye aha alụm di na nwunye n'Ikoyi akwuchaghị ọtọ.

Ọtụtụ ọchịchị ime obodo gwara ọlụikpe ka ọ kwụsị registri nke dị n'Ikoyi, Legọsị na registrị ndị ọzọ dị n'aka gọọmentị etiti inye ndị mmadụ akwụkwọ alụm di na nwunye maka na ha enwegi ikike ya n'akwụkwọ iwu Naịjirịa.

N'oge nke a mechara ihe mere, ndị mmadụ buru akụkọ na akagbụọla inye akwụkwọ na registri Ikoyi, na ọ bụ sọsọ na ọchịchị ime obodo nwere ikike a.

Mana onye ọkaiwu bụ Sonnie Ekwuwosi gwara BBC Igbo na onweghị ihe mkpebi a mebiri.

O kwukwara ka di na nwunye debara aha n'Ikoyi registry' n'oge gara aga ghara ị tụ ụjọ makana asambodo ha nwereisi.

Ekwuwosi kwuru na ọ bu ndị ga-emebi iwu a site ụgbua ga-enweta asambodo na-abaghị uru.

Registri Ikoyi
Nkọwa foto, Ndị mmadụ ka na-agba akwụkwọ na registri Ikoyi

Mana kọmishọna na-ahụ maka ihe gbasara ọchịchị ime obodo na Legọsị bụ Muslim Folami kwuru a ga-eme ka ozi a ruo ndị niile o metutara nti

O kwukwara na mkpebi a pụtara na ndebanye aha n'akwụkwọ ọ bụla e mere n'ụlọọrụ ọchịchị kwụ chịm.

Mana Salome Njoku, bụ onyeisi na ngalaba na-ahụ maka ihe amala na ministri nke na-ahu maka ihe na-eme n'ime obodo, gwara BBC na ụlọikpe amachịghị registri Ikoyi ịgba ndi mmadụ akwụkwọ.

Njoku kwuru, "Ihe gọọmentị Legọsị na-ekwu adịghị mma ma cha, ọkachasị etu ha siri kwuo ihe ezighiezi maka ihe ụlọikpe kwuru."

Njoku kwuru na ọkaikpe ha na-ahazị okwu, na ha ga ekwupụta uche ha maka okwu a.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ