Arsenal egosila CSKA Moscow onye bụ dike

Otu Arsenal

Ebe foto si, Rex Features

Nkọwa foto, Danny Welbeck enyeela goolu atọ n'ime asọmpị abụọ

Otu Arsenal eruola ọkara ịkpeazụ n'asọmpị Europa League na mmeri ha mmeri CSKA Moscow.

N'asọmpị agbara ụnyahụ, ha gbara ọkpụ abụọ abụọ, mana na nchịkọta goolu ha Arsenal jiri ọkpụ isi ha satara atọ wee merie CSKA Moscow.

N'otu CSKA Moscow, Fyodor Chalov na Kirill Nababkin bụ ndị nyere goolu na nkeji iri atọ na itoolu na nkeji iri ise.

N'otu Arsenal, Danny Welberk na Aaron Ramsey bụ ndị nyere goolu na nkeji iri asa na ise na nkeji iri itoolu na abụọ.

Mohamed Elneny

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mohamed Elneny onye Arsenal bu onye a kpọrọ nwoke kachasị gba bọọlụ n'asọmpị a

Ihe ị kwesiri ị ma maka Arsenal na asọmpị Europa

  • Enyeela Arsenal goolu ruru iri atọ na otu n'ime asọmpị niile agbaara n'afọ a. Ha ji ọkpụ atọ karị otu ọzọ n'ime asọmpị Pemier League
  • Arsenal jiri mmeri a ruo ọkara ịkpeazụ n'asọmpị Europa nke mbụ ka mgbe afọ 2008-09
  • Arsenal bụ otu nke ise si mpaghara England ruru ọkara ịkpeazụ baa asọmpị Europa League
  • CSKA emeribeghị n'asọmpị asatọ ha na otu ọbụla sị mpaghara England
Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ