Akụkọ kachasi n'ụtụtụ a: Ndị ntorobịa Naịjirịa katọrọ Buhari
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere n'ụtụtụ a:
Ndị ntorobia Naịjirịa zukọrọ maka ọchịchị Buhari.

Ebe foto si, Getty Images
Otu jikọtara ndị ntorobia ndị Ugwu, Ọhaneze, Yoruba, Ijaw nakwa otu ndị ntorobia ndị ọzọ na Naịjirịa zụkọrọ na Abuja ụnyahụ.
Otu ndị a gbakọro ọnụ katọọ ọchịchị gọọmenti Buhari sị na ọnweghị ihe ha rụpụtara.
Ndị tinyere aka n'akwụkwọ ọkwụ a bụ Shettima Yerima, Okechukwu Isiguzoro, Oweilaemi na Eric Oluwole.
Mba Swizaland na Naịjirịa ekwekọritala maka mpụ.
Nịaịjirịa na Switzerland abinyele aka n'akwụkwo maka ịmalite ịweleta ego Naịjirịa ezupuru na mba.

Ebe foto si, Muhhamadu Buhari/ Facebook
Ndị mba ahụ kwere nkwa na ha ga enyechị Naịjịrịa akụ na ụba ha dị na mba ahụ, ọkachasị ndị Abacha wepụrụ mgbe ọdị ndụ.
Na mba ofesi
Ihe ruru mba 20 na Yurope nakwa US etinyela aka chụpụ ndị Rọshịa na-arụ nyocha nzuzo n'obodo ha.

Ebe foto si, Getty Images
Mba Amerika na Europe agbakọla ọnụ chụpụ ihe karịrị narị mmadụ ndị nnọchịteanya mba Russia ụnyahụ bụ Eke.
Mba abụọ a gbarụrụ ihụ maka nsi a na-ebo na Russia jiri gbuọ Sergei Skripal na ada ya nwaanyi bụ Yulia na England.
N'egwuregwu
Iheanacho agaghi eso sọọ mpi enyi na enyi dị n'etiti Serbia na Naịjirịa

Ebe foto si, Reuters
Nwafor Igbo bụ kelechi Iheanacho na ogbo ya bụ shehu Abdulahi agaghị esọ gbaa bọlụ enyi na enyi nke a ga agba na Serbia ụbọchị Tuzde na abịa.
Onye nkuzi ndị Super Eagles bụ Gernot Rohr si na mmadụ abụọ merụrụ ahụ. Ha ndo. Anụ gbanaa taa echị bụ nta.
Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa
Gere akụkọ mere taa n'otu nkeji
Ihe nkiri nke taa
Ị ga-emenwu ka anụmanụ?
Lekwa nwaamadi na-eje mkpọtụ ụmụanụmanụ ọfụma.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post











