Ndị mgbasa ozi a churu n'ọrụ

Ebe foto si, @AIT_Online
Akụkọ na-eru anyi nti na-ekwu na a chụọla ndị ọrụ ruru nari atọ n'ụlọ ọrụ mgbasa ozi a kpọrọ Ait dị na Naijiria.
Nke a na-abia ka oji otu ụbọchị gafee a chụrụ ndị nọ n'isi oche akwụkwọ mgbasa ozi a kpọrọ Sun Newspaper dikwa na Naijiria.
Mgbe BBC Igbo kpọrọ otu onye na-arụ ọrụ na AIT na-achọghị ka akpọpụta aha ya,ọ gwara anyị na ọ bụ ezumike nka ka mmadụ 330 a lara na AIT.
Akwụkwọ kwuru na ya bụ achụmnọrụ bụ iji we doziarie ọnọdụ na ụlọ ọrụ Daar communications bụ aha isi AIT.
BBC gbakwara otu onye n'ime ndi a chụrụ na Sunnewspaper ajụjụ ọnụ, ọ sị na chọghị ka kpọputa aha ya mana o kwuputere uche ya.
Onye ahụ kwuru na ọ ka nọ na Abuja ebe o mere njem mgbe ozi achum n'ọru a rutere ya nti.
O kwuru na ọ bata Lagos na ọ ga ga nata akwukwọ achụmnọ ọrụ ya mara ihe dị n'ime ya.
kedu ihe otu na-elekota ndi mgbasa ozi na naijirịa na-ekwu?
Onye isi otu na-elekọta ndi mgbasa ozi na Naijiria akpọrọ Waheed Odusile kwuru na ya na ndi otu ya ga-enyocha ihe a mere nụ ka ha chọpụta ihe kpatara ya.
O kwuru na ọ bụrụ na o nweghị ihe ọjọọ ndị a mere,ha ga-agba mbọ hụ na enyere ndi a ego niile diara onye ma ọ kwusi ọrụ.
O kwukwara na ihe nke a wutere ha nke ukwu maka na obodo bụ igwe kita.








