Gọọmentị Ebonyi steeti sị 'onye hụrụ Linus Abaa Okorie jide ya'

Ebe foto si, Linus Okorie Abaa/FB
Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi steeti enyela iwu ka a chọwa ma jide onye bụbu onye nnọchite anya Ohaozara/Onicha/Ivo Federal Constituency bụ Linus Abaa Okorie.
Umahi na-ebo na Okorie gbasara akụkọ ụgha na soshal midia mere e jiri gbuo otu onye ọrụ Ebube Agụ n'Okpuruọchịchị Ikwo dị na steeti ahụ.
Kọmishọna mgbasa ozi steeti ahụ bụ Uchenna Orji kwuru nke a n'ọgbakọ ọ kpọrọ ndị ntaakụkọ ka ha nwechere ọgbakọ pụrụiche gbasara ọnọdụ nchekwa ụbọchị Tuzde n'obi gọọmentị ọhụrụ steeti ahụ.
Maazị Orji na-ebosi ike na ọ bụ maka ihe Okorie dere na Facebook ya mere e jiri gbuo ya bụ onye Ebubeagụ n'Ikwo.
O kwukwara na dị niile aka ha dị n'ogbugbu nwaamadị ahụ nakwa imebi ihe ga-aza ajụjụ gbasara ya.
Linus na onwe ya sị na ọ bụ ihe itụnanya na Gọvanọ Umahi sị na a na-achọ ya achọ.
Ọ sị na ọ dịka Gọvanọ Dave Umahi chọrọ iji Ebubeagu kpagbuo ndị na-azọsa ya ọchịchị.

Ebe foto si, EBONYI GOVERNMENT
Ọ sị na "achọrọ m itisara ụwa mkpu na ihe a bụ ụzọ Gọvanọ Dave Umahi si chọọ imechi ndị niile anọghị na Pati ha ọnụ ma kpagbuo ndị isi ha..."
Ọ kwukwara na Umahi chọrọ ịmegharị ndị mmadụ anya site na ijide ndị okemmadụ nọ na Pati PDP nakwa ijiri ụzọ ahụ zochie arụrụala ọ sị na ndị Ebube agụ na-akpa na steeti ahụ.
Okorie sị na ọ bụ ọrụ aka ndị uweojii ịme nchọpụta maka onye e boro ụdị ebubo a, "ọ bụghị ndị gọọmentị ya ka ọ dịara izipuwe ụdịrị ozi a".
"A chọrọ m ka o doo anya na ndị uweojii akpọbeghị m oku ọbụla".
Okorie sị na tupu ezipu ozi ịchọ mmadụ na ụlọikpe kwesiri itinya aka na-akwụkwọ, nye ikike ị ga kpụta onye ahụ.
Ọ sị na,"ọ bụzị mgbe onye ahụ abịaghị ka aga achọwa ya achọ".
Ọ na-akọwa na ihe gọọmentị Umahi jiri kwuo ụdị okwu a bụ ka ndị Ebubeagu chụwa ya gbuo dịka onye na-agba ọsọ ịza ndị uweojii.
Okorie sị na ndụ ya dịzị n'aka Gọvanọ Umahi ma o nwee ihe mere ya.
Onye bụ Linus Okorie?
Linus Abaa Okorie banyere n'ụlọomeiwu Ebonyi steeti ebe ọ nọchitere anya ndị Ọnịcha n'ụlọomeiwu ahụ site n'afọ 1999 ruo 2003.
Ebe ahụ ka o sikwa gawazie Ụlọomeiwu ukwu ịnọchịte anya ndị Ohaozara/Onicha/Ivo Federal Constituency n'ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa bụ ebe ọ nọ ruo afọ 2015.
O ji ọkọlọtọ PDP gaa ebe ndị a niile.
Nwoke isi ojii gara mkpọrọ maka ya na nwoke onyeọcha nwere otu aha

Ebe foto si, CBS
Otu nwoke isi ojii gara mkpọrọ maka ya na nwoke onyeọcha nwere otu aha.
Nwoke onye isi ojii kpọpụrụ ndị uweojii Las Vegas nke mba Amerịka ụloikpe maka ebubo na ha tinyere ya na mkpọrọ maka na ya na onye ndị uweojii na-ebo ebubo nwere otu aha.
Shane Lee Brown onye isi ojii dị afọ iri abụọ na ise nọrọ ụbọchị isii n'ụlọ mkpọrọ dịka ndị uweojii nwuchiri ya chee na ọ bụ onye ọcha Shane Neal Brown dị afọ iri ise na otu ugbua.
Ọ bụ n'afọ 2020 ka a nwụchịrị Shane Lee Brown n'okporoụzọ mgbe ọ na-egosighị ndị uweojii akwụkwọ ikike o ji anya ụgbọala ya.
Ndị ọkaiwu Shane Lee Brown kwuru na Brown gwara ndị uweojii ọtụtụ mgbe na ọbụghị ya bụ Shane Brown ha na-achọ.
Shane Lee Brown na-achọ dọla puku narị ise ($500,000) n'aka ndị uweojii nke Las Vegas maka ihe ha mere ya.
N'aka nke ọzọ, ọkaiwu ndị uweojii na-ekwu na nwuchi a nwuchiri Shane Lee Brown maka ejighị akwụkwọ ikike ịnya ụgbọala ziri ezi.
Mana ha ekwughị ihe ọbụla maka mkpọrọ ezịghị ezi ha tụrụ ya.
Ndị agha mba Burkina Faso ekwuola ihe ha jiri napụ ndị nkịtị ọchịchị

Ebe foto si, AFP
Ndị agha mba Burkina Faso anapụla Onyeisiala Roch Kabore ọchịchị n'ike n'ihi na gọọmentị alụsoghị otu nnupuisi alakụba na mba ahụ ọgụ etu ọ kwesịrị.
Ọ bụ otu onye agha nọ n'ọkwa dị nta kwupụtara nkea n'akwụkwọ mgbasa ozi Lieutenant Colonel Paul-Henri Sandaogo Damiba binyere aka.
N'ozi a ka o kwuru na ewepụla iwu obodo nwa mgbe nta, wepụ gọọmentị na ndị omeiwu, ma mechie ụzọ niile esi abata mba ha site n'elekere iri na abụọ nke abalị Mọnde.
Etu otu nnupuisi alakụba siri gbanye mgbọrọgwụ na Burkina Faso
Ọ bụ n'afọ 2012 ka ndị otu nnupuisi alakụba sị mba Mali wakporo isi obodo Burkina Faso.
Nke a putere esemokwu n'etiti ndị ofufe nke Kraịst nanke Alakụba na mba ahụ.
Dịka enweghị ezi nchekwa na enyemaka n'ụfọdụ ime obodo nyere ndị otu nnupuisi ohere ịwakpo obodo ndị a ma rata ụfọdụ n'ime ha ịbanye otu ha.
Olembe stadium stampede: Mmadụ asatọ anwụọla na nzọgbụ nzọgbụ mere n'ama egwuregwu Olembe

Ebe foto si, Reuters
Ihe ruru mmadụ asatọ anwụọla dịka ọgbaaghara dapụtara n'ama egwuregwu Olembe n'asọmpị Afcon.
Ọ bụ asọmpị dị n'etiti mba Kamerun na mba Comoros n'asọmpị agba nke iri na isii nke Iko Afcon.
Ọtụtụ ndị mmadụ merụrụ ahụ na ya bụ nzọgbụ nzọgbụ.
Gọvanọ mpaghara etiti mba Kamerun bụ Naseri Paul Biya gwara ndị ntaakụkọ AFP na enwereike ịnwe ndị ọzọ ọdachị a metụtara a na amabeghị.
Ndị ọrụ ogige a na-ekwu na ihe ruru mmadụ puku iri ise chọrọ ịbanye n'ama egwuregwu a maka ya bụ asọmpị.
Dịka ọ dị ugbua, otu na-achịkọta egwuregwu bọọlụ n'Afrịka bụ Confederation of African Football kwuru na ha anụla maka ihe mere ma si na ha ebidola nyocha ha.
Kamerun ji goolu abụọ asatara otu were merie mba Comoros na ya bụ asọmpị.
Iko Afcon 2021
African Cup of Nations nke bụ AFCON n'aha ịchafụ bụ asọmpị egwuregwu bọọlụ otu Confédération Africaine de Football na-achịkọta nke a na-agba kwa afọ abụọ n'Afrịka.
Ọ bụ nanị ndị mba nọ n'Afrịka nwereike ịgba ya bụ asọmpị.
Nkea a na-agba n'ọnwa Jenuwarị afọ 2022 a na mba Kamerun bụ nke ekwesịrị ịgba n'afọ 2021 kama agbaghị ya maka mwakpo Covid-19.









