Ebonyi State: Ihe ndị uweojii gwara ndị Ikwo gbara ọsọ ndụ

Loveth Odah bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ kwuru ka ndị Ikwo niile si Abakiliki gbaa ọsọ ndụ lọghachi.
O kwuru sị, " Anyi ezipụla ndị uweojii na mpaghara niile, anyị anwụchiela ụfọdụ ndị wakporo ndị mmadụ n'Abakiliki".
Odah kwukwara sị, "Anyị na-agba mbọ ịhụ na ebe niile n'Abakiliki nwere udo".
Cheta na ọ bụ ọgụ dapụtara n'etiti ndị obodo Enyigba na Enyibichiri ndị na-azọ ala butere ọgbaaghara nke rutere isi obodo bụ Abakiliki.
Ọ bụ kwa ya bụ ọgụ butere ntọ ụmụaka asaa bụ ndị obodo Enyigba nke dị n'okpuru ọchịchị isii.
Dịka o siri dị, akụkọ na-ekwu na ndị obodo Izzi bidoro ịwakpo ndị Ikwo bi n'Abakiliki, dịka ha kwuru na ọ bụ ha nwe Abakiliki ma sị ndị Ikwo pụọ.
'Ezinụlọ m si Abakiliki gbalaa obodo' - Onye Obodo Ikwo bi n'Ebonyi Steeti
Mazị Uchenna Nwancho bụ onye nkuzi na Mahadum kwuru na ezinụlọ ya gbalara ime obodo ha.
Ọ kwuru sị, " ụmụ m anaghị aga akwụkwọ maka ihe a, ha nọ n'obodo".
Ọ kọwara sị, " a na-anụ kpeukep na a na-awakpo ndị mmadụ, awakpoo onye agbataobi gị ị gaghị eche ka awakpoo gị tupu ị gbaa ọsọ".
Nwancho kwuru na ndị Izii sị na ọ bụ ha nwe ala ma sị ndị Ikwo ha lawa be ha.
Kama otu onye Izzi bụ Luke Nkwegu kwuru na udo alọhachila n'Abakiliki.
O kwuru sị," Izzi na Ikwo bụ nwanne, ha ekwesịghị imepụ ọbara ibe ya. Udo adịrịla".
Ọ kọwara sị na ọ ka mma ka achọta ndị kpara ya bụ mkpamkpa kama ụmụnna abụọ a ekwesịghị ịmepụ onwe ha ọbara.









