Ị pụtakwara kiri ọnwa ọbara?
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Akụkọ ndị dị mkpa n'ụtụtụ a:
Ụnụ amakwa na ọchịchị kpuchiri ọnwa n'abalị ụnyaahụ?
Naịjirịa sonyere mpaghara ndị ọzọ n'ụwa we hụ nwee chinjinabọ kachasị nọtee aka kamgbe afọ otu narị.

Ebe foto si, Getty Images
Naịjirịa
Osote onyeisi ụlọomeiwu sineti bụ Ike Ekweremadu ekwuola na mgbochi e gbochiri ụlọ ya ụbọchị ole gara aga bụ nkata iji chutuo ya na onyeisi ya Bukola Saraki n'ọkwa,

Ebe foto si, @ike_Ekweremadu
Nakwa ịkwụsị ndị APC wufere PDP ka ha ghara iwufe.
Mana o kwuru na ya agaghị ekwe ka onye ọbụla majaa ya.
Ebe ọzọ na Naịjirịa
Ndịgha Naịjirịa ahazigharịala ndịisi Lafiya Dole, bụ atụmatụ ha ji na ebuso Boko Haram agha.
Nke bụ ugboro anọ ewepụrụ onyeisi Lafiya Dole n'ime ọnwa iri na anọ, bụ ihe ndị ma maka ya kwuru bụ maka mwakpo ndị Boko Haram na awakpo ndịgha na nso nso a.
Akụkọ mba ofesi
Facebook abaala na nsogbu

Ebe foto si, Getty Images
Ọ dịka nsogbu gbasara ọkwụ ụgha nke Facebook na-enwe na-emetụtazi ya bụ dike na soshal midia.
Nke a bụ maka na ego e ji azụ oke na Facebook jiri pasentị iri na itoolu gbadaa ebe ha mefuru ihe ruru ndị dọla otu narị na iri abụọ.
N'akụkọ ndị ọzọ,
Egwu Drake na-ebutezi nsogbu na US
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
US akatọọla egwu na-ewu nke Drake kụrụ nke na-eme ka ndị mmadụ wutuo n'ụgbọala na-aga ịgba egwu.
Ụlọọrụ njem na US kwuru ka ndị mmadụ kpachara anya maka o nwereike ibute ihe mberede okporoụzọ
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa:












