Obodo dị iche iche na-eme ngagharịiwe megide ndị ọrụ ICE na mba Amerịka

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Jenụwarị 2026.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu, Uche Akolisa

  1. Francis Nwifuru: Ndị ọrụ nchekwa, chọtanụ ndị kpara mkpamkpa n'Oso Edda

    Gọvanọ Francis Nwifuru

    Ebe foto si, Ebonyi Govt

    Nkọwa foto, Gọvanọ Francis Nwifuru enyela ndị ọrụ nchekwa iwu ka ha chọta ndị gbusịsịrị mmadụ n'Oso Edda

    Aka na-achị Ebonyi Steeti bụ Francis Nwifuru enyela ndị ọrụ nchekwa ntuziaka ka ha mee nchọpụta gbasara ihe butere mwakpo e mere ndị Okpuru Ọchịchị Oso Edda dị na steeti ahụ na nsonso a.

    Na mgbede ụbọchị Tọzde, ndị bu egbe gburu mmadụ anọ, tọrọ ụfọdụ ndị mmadụ ma sunye ọtụtụ ụlọ ọkụ n'obodo Okpojo dị n'Okpuru Ọchịchị Oso Edda dị n'Ebonyi Steeti.

    Nwifuru, onye kwuru na agwa ahụ gosiri 'akwanyeghịrị ndụ ugwu' sịrị: "Enwetara m ozi banyere mwakpo mere na nso nso a n'Oso Edda nke tara isi ndị mmadụ ma bute mbibi akụ na ihe e nwe enwe."

    "Agwa a na-emegide mbọ anyị na-agba iweta udo n'ime ime obodo, anyị agaghị anabata ya."

  2. O nweghị ndị gwara anyị na ha chọrọ ime ihe n’ọgbọ egwuruegwu – Gọọmenti Riva Steeti

    O nweghị ndị gwara anyị na ha chọrọ ime ihe n’ọgbọ egwuruegwu – Gọọmenti Riva Steeti

    Ebe foto si, SIMINALAYI FUBARA, NYESOM WIKE/X

    Gọọmenti Riva Steeti ekwuola na ọ bụghị eziokwu na ha gbachiri ọgbọ egwuruegwu Yakubu Gowon Stadium ka a ghara iji ya hazie ọgbakọ ndọrọndọrọ ọchịchị.

    Ha kọwara ebubo ahụ dịka nke na-abụghị eziokwu, nke na-eduhie nakwa nke e ji egwu ndọrọndọrọ ọchịchị.

    Ọ bụ Kọmịshọna na-achịkọta ihe gbasara egwuruegwu nakwa Nnukwu Ọkaiwu Riva Steeti bụ Christopher Green kwuru nke a oge ọ gara njem ọrụ n’ọgbọ egwuruegwu ahụ.

    Green mere ka o doo anya na a machiri ọgbọ egwuruegwu Yakubu Gowon Stadium dị n’Elekahia ka onye ọbụla ghara ịbanye n’ime ya n’ihi ọrụ ndị na-aga n’ihu ugbua n’ogige ahụ.

    Akụkọ ndị ọzọ si Riva Steeti:

    Kọmịshọna ahụ kwukwara na o nweghị mmadụ maọbụ otu ọbụla webatara akwụkwọ iji rịọ ka e nye ha ohere iji ọgbọ egwuruegwu ahụ mee ihe.

    Ọnọdụ a na-abịa dịka ndị otu Minista na-ahụ maka isi obodo bụ Nyesom Wike boro ebubo na ha tinyere akwụkwọ ka Gọọmenti Riva Steeti nye ha ohere iji ọgbọ egwuruegwu Yakubu Gowon Stadium hazie ọgbakọ ha, mana ọ mịtaghị mkpụrụ.

  3. Obodo dị iche iche na-eme ngagharịiwe megide ndị ọrụ ICE na mba Amerịka

    Obodo dị iche iche na-eme ngagharịiwe megide ndị ọrụ ICE na mba Amerịka

    Puku kwuru puku mmadụ amalitela ime ngagharịiwe n’ogbe ndị e nwere na Minneapolis dịka akụkụ ngagharịiwe zuru mba ọnụ megide omume ndị ọrụ Immigration and Customs Enforcement (ICE).

    Ọnọdụ a na-abịa dịka ndị ọrụ ICE gbagbuchara ụmụafọ Amerịka abụọ n’oge dị iche iche.

    A na-emekwa ngagharịiwe n’obodo ndị ọzọ dị n’Amerịka gụnyere New York, Los Angeles, Chicago na Washington DC.

    Ndị na-ahazi ngagharịiwe ahụ na-akpọ oku ka ndị Amerịka nọrọ n’ụlọ ma ghara ịga ọrụ nakwa ụlọakwụkwọ.

    Ọnwụ Renee Good na Alex Pretti akpaliela ngagharịiwe n’ime obodo ma mekwaa ka ndị mmadụ tipụ mkpu akwa gburugburu mba Amerịka, nke mere ka ndị omeiwu si na pati abụọ a ma ama kwuo okwu nkatọ.

    N’ụbọchị Fraịde 30 Jenụwarị 2026 ka Ngalaba Ikpe Ziri Ezi na mba Amerịka mepere akwụkwọ maka inyocha ihe butere ọnwụ Pretti.

  4. Ndị uweojii anwuchiela mmadụ ise maka ebubo igbu nwoke dị afọ 26 n’Abịa Steeti

    Ndị uweojii anwuchiela mmadụ ise maka ebubo igbu nwoke dị afọ 26 n’Abịa Steeti

    Ebe foto si, Ikechukwu Okoroafo

    Ndị uweojii Abịa Steeti anwuchiela mmadụ ise a na-ebo ebubo na ha gburu Francis Ikechukwu Onuoha gbara afọ iri abụọ na isii na-ere akwa, ma bụrụ nwaafọ Amaokwe Item dị n’okpuru ọchịchị Bende.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abịa Steeti bụ Maureen Chinaka kwupụtara nke a n’ụbọchị Wenezde 28 Jenụwarị 2026.

    Chinaka kwuru na Onyeisi ndị uweojii na-elekọta mpaghara Obingwa natara mkpesa gbasara ọnọdụ ahụ n’ụbọchị Tuzde 27 Jenụwarị, ma site n’ozi ndị bara uru o nwetara, a nwuchiri mmadụ ise a na-enyo enyo.

    Ozi rutere anyị aka kwuru na e gburu Maazị Onuoha n’obodo Ụmụokea, Ahiaba Mbu dị n’okpuru ọchịchị Obingwa.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

    Ụmụnne Onuoha kwuru na ụfọdụ ndị ahụ a na-enyo enyo boro nwanne ha ebubo izu ekwentị ihe dịka afọ abụọ gara aga, bụ nke mere ndị uweojii jiri nwuchie ya ma mechaa tọhapụ ya, mana ka e mesịrị, okwu ahụ welitere isi ọzọ tupu ọ nwụọ.

    Nne Onuoha boro ebubo na ndị ahụ a na-enyo enyo wakporo ụlọ ha dị na Deeper Life Road mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere iri na otu nke abalị ma dọkpụrụ nwa ya nwoke n’ike, mekpaa ya ahụ ma merụọ ya nnukwu ahụ.

    Ka o sina dị, ndị uweojii kwuru na ha enyefeela okwu ahụ n’aka ngalaba ha na-ahụ maka ndị omekome bụ State Criminal Investigation Department (SCID), bụ ndị maliterela ime nnyocha miri emi gbasara okwu ahụ.

  5. Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma nụ, Ọfọ anyị bụ nka ngwụcha ọnwa a ghara ịbụ ngwụcha gị

    Anyị ji obi aṅụrị na-anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Satọde 31 Jenụwarị 2026.

    Biko, sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ, maka akụkọ gbasara ihe niile na-eme n'ụwa.

    Ya gazie!

  6. Otu Chriatian Association of Nigeria akatọọla oku ndị Okpukperechi Alakụba na-akpọ ka e wepụ onyeisioche INEC

    Njirimara otu CAN na otu SCSN

    Ebe foto si, Facebook

    Otu Christian Association of Nigeria akatọọla out ndị okpukperechi alakụba na-akpọ ka a chụọ Ọkammụta Joash Amupitan dịka onyeisioche ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec).

    Nke a na-abịa dịka otu Supreme Council for Shari’ah in Nigeria (SCSN) mere ka o doo any ana ndị ụka Alakụba na Naịjirịa agaghị anabata ntuliaka ọbụla onyeisioche Inec bụ Ọkammụta Joash Amupitan haziri.

    Ozi onyeisi otu SCSN bụ Sheikh Bashir Umar wepụtara, kwuru na ihe mere ha ji akpọ oku a bụ maka na ha ekwenyeghị na Ọkammụta Amupitan enweghị ike ịhazi ntuliaka kwụrụ ọtọ na Naịjirịa ma kwuo na ndị ụka alakụba agaghị anabata mpụtara ntuliaka ọbụla ọ haziri.

    Na nzaghachi ha, otu CAN mere ka o doo any ana oku ọbụla ndị okpukperechi alakụba zoro n’okpuru Sharịa na-akpọ ka e wepụ Ọkammụta Amupitan dịka onyeisioche Inec ga-akpụ afọ n’ala.

    Odeakwụkwọ otu CAN bụ Bishọpụ Mohammed Naga kwuru na ha amaghị ihe mere ndị ụka alakụba ji akpọ oku ahụ.

    O kwuru na iwu Naịjirịa kwadoro Ọkammụta Amupitan maọbụ onye ọbụla ịbụ onye okpukperechi ọbụla masịrị ya ma kwuo na enweghị ihe nke nwere ime banyere ntụkwasịobi e nwere ebe onye ahụ nọ.

  7. Ndị ojiegbe wakporo obodo, gbuo mmadụ anọ ma tọọrọ ọtụtụ ndị ọzọ n'Ebonyi Steeti

    Ụlọ a gbara ọkụ

    Ebe foto si, Screengrab

    Ndị uweojii Ebonyi Steeti si na ha na-enyocha ogbugbu e gburu opekatampe mmadụ anọ n'obodo Oso Edda dị na steeti ahụ bụ nke a na-eche na ọ bụ nsogbu ala dara n'etiti obodo Oso Edda dị n'Edda na ndị Afikpo dịkwa n'Ebonyi Steeti.

    Akụkọ kwuru na ndị bu egbe a sị si Amasiri, wakporo Oso Edda gbupu mmadụ anọ isi, sunye ọtụtụ ụlọ ọkụ n'abalị Tọzde 29 Jenụwarị, 2026.

    Kọmịshọna steeti ahụ na-ahu maka nchekwa obodo bụ Ichie Etta Udeh kwuru na ya bụ ihe mere n'ezie ma sị na e tinyela ndị nchekwa na obodo ahụ.

    Ọ sịrị, "Ọ bụ ihe mere eme, n'ebe elekere ise nke mgbede ụbọchị Tọzde, a kpọrọ m oku, gwa m na ndị agboro gara na obodo Oso Edda gbuo mmadụ anọ."

    N'otu aka ahụ, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Joshua Ukandu gwara BBC n'ekwentị na ya bụ ihe bụ ihe ọ kpọrọ "esemokwu ala dịarala ọtụtụ afọ" tara isi mmadụ atọ ozigbo, ebe otu onye merụrụ ahụ nwụrụ n'ụlọgwụ n'ụtụtụ Fraide.

    "O mere ebe elekere asaa nke mgbede"

    Cheta na obodo abụọ a gbara onwe ha agbataobi na-ese ọkwụ ala nke tarala isi ọtụtụ mmadụ.

  8. Fela abụrụla onye Afrịka ga-erite nturuugo 'Grammys Lifetime Achievement Award'

    Fela Kuti, ebe ọ na-achị ọchị

    Ebe foto si, Getty Images

    Ṅdị nile egwu ya na-amasị ma ya kemgbe dịka 'Eze egwu Afrobeat' mana n'ọnwụ Fela Kuti eritela nturuugo 'Grammys Lifetime Achievement' ka ọ gachara afọ 30 o jiri nwụọ.

    Fela nwụrụ n'abalị abụọ nke Ọgọstụ, afọ 1997, ka ọ gbachara afọ 58.

    Nwa ya nwoke bụkwa otiegwu, Seun Kuti gwara BBC sị,"Fela anọọla n'obi ọtụtụ ndị mmadụ ogologo oge. Ugbua Gran=mmys kwanyereya ugwu, nke a bụzị mmeri abụọ."

    Enyi Fela ma bụụkwa onye nhazi ya bụ Rikki Stein kwuru nturugo ahụ Grammys "ka mma na ọ na ọ bịaghị n'oge kama abịaghị cha cha".

    N'ụwa nile, Afrobeat bụ ụdị egwu Fela malitere, na-eme ọfụma nke mere Grammy ji kewapụta ya n'afọ 2024 dịka ngalaba ha ji enye onye Afrika kacha mma n'ụdị egwu ahụ nturugo.

    N'afọ a, Burna Boy so na ndị a kpọrọla aha ha nwere ike irite nturuugo na ngalaba" Efere Egwu Kachasị Mma n''Ụwa(the Best Global Music Album.)

    Ndị enyi na ikwu na ibe Fela Kuti' ga-aga emume Grammys afọ maka ịnata nturuugo ya.

    Ndị otiegwu ga-erite nturuugo a gụnyere onye ọkpoubo Mexicobụ Carlos Santana, otiegwu Amerịka a ma ama dịka "Ezenwaanyị Punk' bụ Chaka Khan na Paul Simon.

  9. Trump ekwuola na mmekọrịta UK na Chaịna bụ 'ihe dị oke egwu'

    E kwupụtara nkwekọrịta ọhụrụ a mgbe Sir Keir zutere onyeisiala mba Chaịna Xi Jinping dịka ọ gara njem nleta abalị atọ na Chaịna.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, E kwupụtara nkwekọrịta ọhụrụ a mgbe Sir Keir zutere onyeisiala mba Chaịna Xi Jinping dịka ọ gara njem nleta abalị atọ na Chaịna.

    Donald Trump ekwuola na ọ bụ "nnukwu ihe dị egwu" na mba UK na China na-emekọ ihe dịka Praịm Minista Sir Keir Starmer gara n'ihu na nleta ya na Beijing iji weghachi mmekọrịta mba abụọ.

    Onyeisiala mba Amerịka kwuru nke a na nzaghachi nkwekọrịta mba abụọ ahụ nwere iji mee ka azụmaahịa na itinye ego dị n'etiti mba UK na mba Chaịna bawanye.

    Cheta na e kwupụtara nkwekọrịta ọhụrụ a mgbe Sir Keir zutere onyeisiala mba Chaịna Xi Jinping dịka ọ gara njem nleta abalị atọ na Chaịna.

    O nwere "ihe dị oke egwu nye ha ime nke ahụ," Trump kwuru na mmalite nke ihe nkiri gbasara nwunye ya Melania Trump mgbe a jụrụ ya ihe o chere gbasara Briten ịbawanye mmekọrịta azụmaahịa ya na Chaịna.

    N'ịzaghachi okwu Trump, obi ọchịchị mba UK bụ Downing Street kwuru na obi ọchịchị mba Amerịka bụ Washington mara ebumnuche ya tupu oge njem ahụ eruo.

    Lee akụkọ ọzọ ga-amasị gị ebe a:

  10. Ụmụ Igbo ndị ọma, unu abọọla chi?

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Fraịde 30 Jenụwarị, 2026.

    Anyị na-asị ka ọ dịrị onye ukwu na onye nta mma.

    Biko, sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ gbara ọkpụrụkpụ si na Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa niile.

    Sonyekwara anyị n’akara Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ maka akụkọ foto na vidio anyị ji bịa taa.

    Udo dịrị unu.

  11. Lee ihe dị ọkpụrụkpụ na nkwekọrịta mba Chaịna na UK

    Praịm mịnịsta UK bụ Keir starmer zutere Onyeisiala Xi Jinping

    Ebe foto si, Getty images

    Praịm mịnịsta mba Brịten bụ Keir Starmer gara njem nleta na mba Chaịna ma zute Onyeisiala mba Chaịna bụ Xi Jinping na Beijing ebe ha nwere nkwekọrịta dị icheiche.

    Starmer kọwara nkwekọrịta ahụ dịka ihe gbara ọkpụrụkpụ.

    Nkwekọrịta ndị ahụ gunyere na:

    • Ụmụamaala Briten ga-eje mba Chaịna zụọ ahịa maọbụ njem nleta abalị iri atọ na-ejighị akwụkwọ ikike mbata na ọpụpụ(vịsa.) Nke a mere Briten ka ha rite uru mba dịka Fransị, Jamịnị na Ọstrelịa na-erite.
    • Ụlọọrụ na-arụpụta ọgwụ bụ AstraZeneca ga-etinye ego ruru $15bn (£10.9bn) na Chaịna ruo 2030.
    • Mana Xi kọwara nkwekọrịta ahụ dịka mgbanwe na mmekọ ha na UK.

    Nkwekọrịta mba Chaịna na Briten nwere ruru iri nke gụnyere ịbeleta ụtụisi tarifu na ngwaahịa dị icheiche.

  12. Afcon 2025: CAF ataala mba Senegalụ, Moroko ahụhụ maka agwa ha n'oge asọmpị

    Otu egwu Bọọlụ ndị Senegalụ

    Ebe foto si, Getty Images

    Otu na-ahazi egwuregwu bọọlụ n'Afrịka bụ Confedeation of African Football (CAF) amaala onye nchịkọta otu egwu bọọlụ mba Senegalụ bụ Pape Thiaw ahụ maka agwa ya n'Afcon2025.

    CAF manyere Pape Thiaw ntarama ahụhụ nkwụsị ọrụ nwa mgbe nta ma daa ya nha ego dị $100,000.

    Ha sị na nke a bụ maka na Thaw nyere ndị otu egwu bọọlụ ya iwu ka ha kwụsị ịgba bọọlụ, si n'ime ama egwuruegwu pụọ mgbe ha na mba Moroko na-agba asọmpi nke ikpeazụ nke asọmpi Afcon a gbara na mba Moroko na nso nso a.

    CAf dakwara otu egwu bọọlụ Senegal nha, $615,000.

    N'aka nke ọzọ, CAF dakwara otu egwu bọọlụ Moroko nha ego dị $315,000 maka agw a ha kpara na asompi ahụ.

    Otu nchịkọta bọọụ n'Afrịka ahụ gara n'ihu machie Achfra Hakimi ịgba asọmpi abụọ maka agwa ya n'oge asọmpi ahụ.

    Cheta na Senegal zọpụrụ n'ime n'oge asọmpi ha na Moroko n'ihi agwa Moroko kpara n'oge

    • Afcon 2025: Osimhen, Iwobi, Ndidi na ndị 'Super Eagles' ọzọ ga-agbara Naịjirịa bọọlụ
    • Zaa Ngwangwa : Etu m si banye 'Super Eagles'-Francis Uzoho
    • Naịjirịa agbaala Mozambik ụkwụ n'éhé
  13. Mmadụ 15 anwụọla dịka ụgbọelu kpọkara na Colombia

    Ihe mberede ahụ mere na mpaghara ugwu dị na North Santander nke Colombia.

    Ebe foto si, Notiplaya via Reuters

    Nkọwa foto, Ihe mberede ahụ mere na mpaghara ugwu dị na North Santander nke Colombia.

    Ụgbọelu ndị njem akpọkala na mpaghara ugwu nke mba Colombia, ma gbuo mmadụ iri na ise niile nọ n'ime ụgbọelu ahụ, dịka ụlọọrụ ụgbọelu Satena nke steeti si kwuo.

    Ụlọọrụ ahụ kwuru na ụgbọelu ha ahụ - nke bụ Beechcraft 1900 - "nwere ihe mberede dị egwu", mana ha enyeghị nkọwa ọzọ. Ugbu a, a chọpụtala na ihe mberede ahụ mere na mpaghara ugwu.

    E kwuru na ndepụta ndị njem ahụ gụnyere onye omeiwu bụ Diógenes Quintero Amaya na Carlos Salcedo, onye ga-azọ ọkwa na ntuliaka ndị omeiwu na-abịa.

    Satena kwuru na ụgbọelu ahụ furu efu nkeji iri na otu tupu oge ọ ga-ada n'obodo Ocaña, dị nso n'okeala Venezuela, n'elekere iri na abụọ na nkeji ise nke oge mpaghara n’ụbọchị Wenezde 28 Jenụwarị, 2026.

    Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

  14. Gọọmenti Anambra Steeti enyela iwu ka e mechie ụlọakwụkwọ ndị jụrụ ịgba ụmụakwụkwọ ọgwụ mgbochi

    Gọọmenti Anambra Steeti enyela iwu ka e mechie ụlọakwụkwọ ndị jụrụ ịgba ụmụakwụkwọ ọgwụ mgbochi

    Ebe foto si, ABS

    Kọmịshọna na-ahụ maka ahụike n’Anambra Steeti bụ Afam Obidike agwala ndị isi okpuru ọchịchị niile e nwere na steeti ahụ ka ha gbachie ụlọakwụkwọ ọbụla na-ekweghị ka a gbaa ụmụakwụkwọ ọgwụ mgbochi n’okpuru ọchịchị ha.

    Obidike kpughere nke a oge ya na ndị isi okpuru ọchịchị iri na otu dị n’Anambra Steeti nwere nzukọ gbasara ọgwụ mgbochi akpata na rubella a ga-amalite ịgba ụmụaka oge na-adịghị anya.

    Ọ gbara ndị isioche ahụ ume ka jiri ihe omume ahụ kpọrọ ihe dị oke mkpa ma hụkwa na ọ gara siriri werere, dịka ọ gwara ha chụọ onye ọbụla na-ejighị ọrụ ya kpọrọ ihe.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

    Na mbụ ka odeakwụkwọ ụlọọrụ na-elekọta obere ụlọahụike ndị e nwere n’Anambra steeti bụ Pharmacist Chisom Uchem kwuru na ebumnobi nzukọ ahụ bụ iji nye aka belata ọrịa akpata na rubella na steeti ahụ nakwa gburugburu Naịjirịa.

    Onyeisi na-ahụ maka ịgba ọgwụ mgbochi n’Anambra Steeti bụ Edith Onwuka kọwara na ebumnobi ihe omume ahụ bụ iji gbochie ọrịa n’etiti ụmụaka ndị tozuru oke.

    Onwuka gbakwunyere na a chọpụtala ọrịa rubella n’okpuru ọchịchị Njikọka, Agụata, Ihiala na Orumba North.

  15. Trump agwala Ịran na 'oge na-agafe' maka inwe nkwekọrịta nuklia

    Mba Ịran na-ekwusi ike na nuklia ha bụ nke udo kpamkpam

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Mba Ịran na-ekwusi ike na nuklia ha bụ nke udo kpamkpam

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump adọọla mba Ịran aka na ntị na ‘oge na-agafe’ iji nwee mkparịta maka nkwekọrịta gbasara nuklia ha dịka ndịagha Amerịka na-adị njikere n'ọwara Gulf.

    Onyeisiala mba Amerịka kwuru na "nnukwu Armada" "na-aga ngwa ngwa, nwereike dị ukwuu, ịnụ ọkụ n'obi, na nzube" n'ebe Ịran nọ, n'ebe ọtụtụ ụgbọmmiri ndịagha mmiri Amerịka.

    Na nzaghachi, Minista mba ofesi nke mba Iran bụ Abbas Araghchi kwuru na ndịagha mba ahụ dị njikere iji "zaghachi ozugbo n’ike" maka mwakpo ọ bụla site n'ala maọbụ n'oke osimiri.

    Mba Ịran na-ekwusi ike na nuklia ha bụ nke udo kpamkpam ma gọnarị ebubo mba Amerịka na ndị otu ya na-ebo ya ugboro ugboro na ha na-achọ imepụta ngwaagha nuklia.

    Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a:

  16. Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma!

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tọzde 29 Jenụwarị, 2026.

    Anyị na-asị ka ụbọchị taa gara onye niile nke ọma.

    Biko, sonyere anyị dịka anyị na-ewetere gị akụkọ gbara ọkpụrụkpụ si na Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa niile.

    Sonyekwara anyị n’akara Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ maka akụkọ foto na vidio anyị ji bịa taa.

    Ya gazie gị.

  17. Akụkọ kwuru na anyị machiri onye nọ mahadum ile ule Jamb bụ akụkọ ụgha - Jamb

    Ishaq Oloyede

    Ebe foto si, Jamb

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ule e ji abanye mahadum bụ Joint Matriculation Board(JAMB) ekwuola na ọ bụghị ịda iwu ma onye nọ mahadum debanye aha ya maka ule ịbanye mahadum.

    Nke a na-abịa dịka akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ebo ebubo na Jamb chọrọ ka ndị nọrọla na mahadum gbaghapụ ohere agụmakwụkwọ ha nwerela tupu ha enwee ohere ilegharị ule mbata mahadum.

    Mana n'ozi nke ụlọọrụ ahụ wepụtara n'akara obaozi X ụbọchị Wenezde, Jamb kwuru sị na otu onye agaghị enwe ohere agụmakwụkwọ n'ebe abụọ otu mgbe.

    Ozi ahụ sịrị: "O bụghị ịda iwu onye nọ na mahadum idenye aha maka ule UME/DE. Mana ịhapụ ikwupụta nke a bụ ịda iwu. Ịgba n'anwụ na ngwangwa onye ahụ nwetara ohere agụmakwụkwọ ọhụrụ ọzọ, nke ochie eme."

    Jamb rụtụrụ aka na ụfọdụ ụmụakwụkwọ ewerela ile ule dịka akaọrụ, ma sị na atụmatụ ọhụrụ ahụ bụ iji kụọrọ ndị dị otu ahịa.

    Akwụkwọ mgbasaozi si Jamb

    Ebe foto si, Jamb

    Nkọwa foto, Akwụkwọ mgbasaozi si Jamb
  18. Onyeisiala Zelensky akatọọla ogbunigwe Rọshịa tụrụ gburu mmadụ ise na-eme njem n’ụgbọoloko

    Mba Rọshịa na-atụọla ogbunigwe ugboro ugboro na mba Yukren

    Ebe foto si, Ukraine's DSNS emergency service/Kharkiv region

    Onyeisiala mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky akatọọla mwakpo ogbunigwe droonu mba Rọshịa tụrụ ụgbọoloko bu ọtụtụ ndị na-eme njem nke gburu mmadụ ise ma merụọ ọtụtụ ndị ọzọ ahụ.

    Akụkọ kwuru na ihe ruru mmadụ 200 nọ n’ụgbọoloko ahụ oge a tụrụ ogbunigwe ahụ n’ugwu-ọwụwa anyanwụ dị na mpaghara Kharkiv n’ụbọchị Tozde 27 Jenụwarị, 2026.

    Onyeisiala Zlensky kwuru na mmadụ 18 nọ n’akụkụ ụgbọoloko ahụ droonu ahụ metụtara ma kwuo na ọmaghị ihe mere mba Rọshịa ji tụọ ndị nkịtị ogbunigwe ahụ.

    Ka ọ dị ugbua, mba Rọshịa ekwubeghị ihe ọbụla banyere nke mana cheta na ha na-atụ ogbunigwe na Yukren n’ime afọ ole na ole gara aga.

  19. Ụtụtụ ọma ndị ọma

    Anyị ji obi ụtọ anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Wenezde 28 Jenụwarị, 2026 ma bụrụkwa ahịa Eke.

    Anyị ji akụkọ gbara ọkpụrụkpụ si Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa niile bịa taa.

    Sonyere akara Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ maka akụkọ foto na vidio anyị ji bịa taa.

    Nnọọ..

  20. Onyeisiala Tinubu 'nọ n'ọnọdụ dị mma' agbanyeghị na ọ dara n'oge emume nnabata ya na mba Turkey

    Tinubu yiri ka o nweghị ihe merụrụ ahụ dịka onye enyemaka ya bụ Sunday Dare kwuru na o nwere ike ịga n'ihu na nzukọ abụọ ahụ.

    Ebe foto si, Anadolu via Getty Images

    Nkọwa foto, Tinubu yiri ka o nweghị ihe merụrụ ahụ dịka onye enyemaka ya bụ Sunday Dare kwuru na o nwere ike ịga n'ihu na nzukọ abụọ ahụ.

    Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu "nọ n'ọnọdụ dị mma" n'agbanyeghị na ọ dara ada n'oge emume nnabata ya na mba Turkey dịka otu n'ime ndị enyemaka ya si kwuo.

    Tinubu, dị afọ iri asaa na atọ, dara ada ka onye otu ya na mba Turkey na-anabata ya n'emume gọọmenti mere n'isi obodo Ankara.

    Mgbe ọ gafere otu ndịagha na ndị isi, a hụrụ Tinubu na vidiyo gọọmenti dị n’akara X nke onyeisiala Turkey ka ọ na-aga n'aka nri ya mgbe ọ sụrụ ngọngọ ma daa.

    Ihe nkiri ahụ kwụsịrị dịka a na-ahụ ndị mmadụ ka ha na-enyere onyeisiala aka, mana mgbe sekọnd iri anọ na ise gachara, a setere Tinubu na Recep Tayyip Erdogan dịka ha na-aga n'akụkụ ibe ha.

    Tinubu yiri ka o nweghị ihe merụrụ ahụ dịka onye enyemaka ya bụ Sunday Dare kwuru na o nwere ike ịga n'ihu na nzukọ abụọ ahụ.