Etu e si tụkpuo Angela Okorie n'ụlọmkpọrọ

Angela Okorie na-eme ejije.

Ebe foto si, Angela Okorie / Intagram

Nkọwa foto, Angela Okorie
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Kemgbe akụkọ pụtara na a nwụchiri onye na-eme ejije a ma ama bụ Angela Okorie ma tụkpuo ya n'ụlọ mkpọrọ, BBC gbara mbọ ịchọpụta nke bụ eziokwu.

Cheta na akụkọ malitere ifegharị banyere nwụchi ndị uweojii nwụchiri Angela Okorie na Legọs Steeti ma buga ya Abuja maka ebubo ịkparị mmadụ, nkatọ na ịkpọrị mmadụ n'ịntanetỊ nke bekee kpọrọ 'cybercrime'.

Akụkọ kwukwara na a kpụpụrụ Angela Okorie ụlọikpe dị n'Abuja ebe ụlọikpe nyere iwu ka a tụnye ya n'ụlọmkpọrọ Suleja dị n'Abuja.

Ka ọ dị ugbua, amabeghị ụlọikpe nyere mkpebi ka a tụnye Okorie n'ụlọmkpọrọ.

Oge BBC kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abuja nakwa Legọs steeti, ha gwara anyị ihe dị iche iche banyere akụkọ a.

Angela Okorie na-eme ejije.

Ebe foto si, Angela Okorie / instagram

Nkọwa foto, Angela Okorie

Ihe ndị uweojii gwara anyị

Angela Okorie na-eme ejije.

Ebe foto si, Angela Okorie.

Nkọwa foto, Angela Okorie.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs steeti bụ Abimbola Adebisi kwuru na "ọ bụ eziokwu na a nwụchiri Angela Okorie mana ọ bụghị ndị uweojii Legọs nwụchiri ya".

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ ngalaba ndị uweojii na'ahụ maka mpụ ịntanetị bekee kpọrọ 'cybercrime unit' ndị uweojii Abuja nwụchiri ya ma kpụpụ ya ụlọikpe.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii

Onye bụ Angela Okorie?

A mụrụ Angela Okorie na 17 Ọgọst, 1985 na Cotonou dị na mba Benin.

Ọ bụ onye Ishiagu dị n'okpuru ọchịchị Ivo dị n'Ebonyi Steeti.

Ọ gara mahadum University of Lagos ebe ọ nwetere nzere n'emume ejije bekee kpọrọ Theatre Art ma gụọ maka nhazi ọhanaeze na mahadum Lagos State University.

Okorie malitere ime ejije n'afọ 2009. Ejije mbụ ya bụ 'Sincerity' nke pụtara n'afọ 2009.

O meela ejije ruru otu narị ma nweta onyinye nturuugo dị iche iche.

Angela Okorie na-eme ejije.

Ebe foto si, Angela Okorie / Intagram

Nkọwa foto, Angela Okorie