Ihe Jamb gwara BBC maka Chinedu Okeke nwetara akara 375 n'ule UTME

Ebe foto si, Jamb Website
Akụkọ apụtala banyere otu onye n'ime mmadụ iri ahụ ụlọọrụ Joint Admissions and Matriculation Board (Jamb) kwuru na ha kachasị nweta akara di elu n'ule Jamb afọ 2025.
Cheta na Jamb nọọrọ n'ọgbakọ ha nwere n'Abuja n'ụbọchị Tuzde 8 Julaị, 2025 wepụta ozi kwuru na ụmụakwụkwọ iri ahụ bụ ndị akara ule ha kachasị n'ule afọ a.
Mmadụ iri ahụ gụnyere Chinedu Okeke si Anambra Steeti, onye nwetara akara 375, Ayuba Simon-Peter John si Ogun steeti nwetara akara 374, Jimoh Abdumalik Olayinka si Kwara steeti nwetara akara 374 nakwa Roberts Damiete Ayibo si Rivas steeti, Ononugbo Chigozirim Chibueze si Enugwu steeti na Olawepo Gertrude Tunmise si Kwara steeti, bụ ndị nwetara akara 373 n'otu n'otu.
Ndị ọzọ gunyere Afonata Ofeoritse Leslie na Azoyenime Samuel Chukwumemeka si Delta steeti, Oyebade Oluwapelumi Emmanuel si Ogun steeti na Omigie Osaigbovo Cecil si Edo steeti nwetara akara 372 n'otu n'otu.

Ebe foto si, Jamb Website/UNN Website
Ihe Jamb gwara BBC
Mana akụkọ anyị malitere ịnụ bụ na Onyeisi ụlọọrụ Jamb bụ Ọkammụta Ishaq Oloyede kwuru na e nwere ihe ha chọpụtara banyere Chinedu Okeke, onye ha kwuru na akara ya kachasị n'ule Jamb 2025.
N'okwu ya, Chinedu Okeke dere ule Jamb 2025 iji nweta ohere ịgụ Mechanical Engineering na mahadum University of Lagos, bụ nwataakwụkwọ mahadum University of Nigeria, Nsukka.
Iji chọpụta nke bụ eziokwu, BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru Jamb bụ Fabian Benjamin, onye gwara anyị na ha chọpụtara na Chinedu Okeke nwetara ohere ịgụ 'Medicine and Surgery' na mahadum University of Nigeria Nsukka n'afọ 2021.
N'okwu ya "Nchọpụta anyị gosiri na Chinedu Okeke dere ule Jamb n'afọ 2021 ma kwuo na ya bụ onye Legọs steeti," ka Fabian Benjamin gwara anyị.
"Oge o debanyere aha ya n'ule Jamb 2025, Chinedu Okeke kwuru na ya bụ onye Anambra steeti ma chọọ ịgụ Mechanical Engineering na mahadum University of Lagos. Ọ bụ nke a mere anyị ji kpọtụrụ UNN", ka Fabian Benjamin gbakwụnyere.

Ebe foto si, Jamb Website/Inya Egwu Agha/Facebook
Ihe Mahadum Nsuka kwuru maka okwu a
N'aka nke ọzọ, mahadum University of Nigeria Nsuka kwuru na ha amaghị maka ya bụ akụkọ nakwa nchọpụta ahụ Jamb mere banyere Chinedu Okeke.
Ọ bụ ọnụ na-ekwuru mahadum University of Nigeria Nsukka bụ Agha Egwu Inya gwara anyị nke a oge anyị kpọtụụrụ ya.
O kwuru na "Onye ji ọkwa Registrar mahadum UNN mere njem ọrụ, ọ bụ ya nwereike ịkọwa ma ụlọọrụ Jamb ha mere ka ọ mata banyere nke a."
Ọ gwara anyị na ya amaghị nwataakwụkwọ ahụ kama na ọ ga-eme nnyocha iji chọpụta ma Chinedu Okeke ọ bụ nwataakwụkwọ UNN.
Ka ọ dị ugbua, Fabian Benjamin ekwuola na ha na-eme nnyocha iji chọpụta ihe niile banyere akụkọ a.










