Ụmụnwaanyị emeela ngagharịiwe megide ụlọọrụ Jamb n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa

Mgbe ụmụnwaanyị na-eme ngagharịiwe wuchiri n'ihu ụlọọrụ Jamb dị n'Ogui Enugwu Steeti.
Nkọwa foto, Ụmụnwaanyị ndị a kpọrọ oku ka a kagbuo ule Jamb niile e lere na Naịjirịa n'afọ 2025.
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Nsogbu dapụtara n'ule ịbanye na mahadum Naịjirịa a kpọrọ Jamb nke afọ 2025, mere e jiri kagbuo ụfọdụ ule ahụ ọkachasị ndị nọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa lee ule ahụ.

Ụlọọrụ na-ahazị ule ahụ kwuru na a ga-elegharị ya bụ ule n'ime ụbọchị abụọ ha kagbuchara ya, mana kamgbe ahụ ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu akatọọla agwa a ha kpara.

Nke a so n'ihe mere ụmụnwaanyị chịkọbara onwe ha ọnụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa jiri mee ngagharịiwe n'ụbọchị Tuzde 20 Mee maka nkagbu na nlegharị ule ahụ.

Nwaanyị ji akwụkwọ e dere 'Weghachite ntụkwasịobi na Jamb ma mee ke e legharịa ule na Naịjirịa niile."
Nkọwa foto, Nwaanyị ji akwụkwọ e dere 'Weghachite ntụkwasịobi na Jamb ma mee ke e legharịa ule na Naịjirịa niile."

Onyendu ha bụ ọkammụta Joy Ezeilo kpọrọ oku ka a kagbue ule Jamb nke afọ a bụ 2025 ma legharia ya na Naịjirịa niile.

Ọ gbarụrụ ihu kwuo na ọ bụ mmegbu nye ndị Igbo na Jamb kagburu ule ha ma tinyekwa ndegharị ya n'ụzọ n'ezighi ezi.

Ụmụnwaanyị ahụ ji abụ na ukwe egwu ma burukwa ọkọlọtọ dị iche iche gaa n'ụlọọrụ Jamb dị n'Ogui, Enugwu Steeti.

Mana ndị ụlọọrụ Jamb gbachiri ụzọ ha, na-enyeghị ohere ka ndị a kwupụta etu iwe si dị ha n'obi.

Ezeilo gwara ndị ntaakụkọ na ha ga-ewere ya bụ akwụkwọ mkpesa nye ha n'ụzọ e si eziga ozi.

Otu nwaanyị ọzọ bụ Sylvia Abana gwara BBC na ọ bụ ihe ịgba anya mmiri na oge ọbụla mmegide Jamb bụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ka o si ebido.

Ha kpọrọ oku ka e bido n'afọ iri gara aga wee nyochaa mpụ na aghụghọ niile merela n'ụlọọrụ Jamb.

 Ụfọdụ ụmụakwụkwọ sokwa mee ngagharịiwe ahụ n'Enugwu megide ụlọọrụ Jamb
Nkọwa foto, Ụfọdụ ụmụakwụkwọ sokwa mee ngagharịiwe ahụ n'Enugwu megide ụlọọrụ Jamb
Ụmụnnwaanyị mere ngagharịiwe n'Ebonyi Steeti megide ụlọọrụ Jamb.

N'otu aka ahụ, ụfọdụ ụmụnwaanyị bukwa ngagharịiwe gaa n'ụlọọrụ Jamb dị n'Abakiliki nke Ebonyi Steeti.

Ndị a gosikwara iwe ha banyere etu ụlọọrụ Jamb si ahazi ule ọkachasị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ma kpọọ oku ka e lebara nsogbu ahụ anya.