Africa Games 2019: Ụmụ Igbo kpokọtara ọla n'asọmpi

    • Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo

Ụmụ Igbo gosiri na ha bụ atakata a gbọọ dịka ha so kpokọọ ọla dị iche iche n'asọmpi Africa Games e mere na mba Moroko n'ọnwa Ọgọstụ 2019.

Igbo nwere mmadụ n'ezie. Nke a gosiri onwe ya n'asọmpi a, dịka ha nọ na-atụtụ ọla n'akanri na akaekpe.

Naịjirịa nwetara mkpokọta ihe nrite 127 n'asọmpi a, mana lee ndị Igbo so tụkọta ihe nrite ndị ahụ.

Eze Joy Ogbonne

Ogbonne a mụrụ ụbọchị isii nke ọnwa Juun 2004, gara asọmpi ahụ bụrụ 'agụ'.

Nwaada a kpokọtara ọlaedo atọ.

Ọ bụ onye Ebonyi steeti.

Amalaha Joy Chika

Amalaha a mụrụ ụbọchị 28 nke ọnwa Ọktoba 1997, ji aka na-ekpokọ ọla n'asọmpi ibuli igwe e ji akpụ ụzụ.

O nwetara otu ọlaedo na ọlaọcha abụọ na nke afọ 2019 a.

N'afọ 2014, o nwetara ihe nrite ọlaedo n'asọmpi Commonwealth, mana a napụrụ ya mmeri ahụ makana a chọtara 'ọgwụ ike' n'ahụ ya.

Ọ bụ onye Abịa steeti.

Kalu King

Kalu a mụrụ ụbọchị 11 nke ọnwa Nọvemba 1995, tụtụchara ọla atọ a na-enye n'asọmpi ibuli igwe.

O nwetara otu ọlaedo, otu ọlaọcha na otu ọlanchara.

Ọ nọchitekwara anya Naịjirịa n'asọmpi Commonwealth nke afọ 2014.

Eke Uche Devon

Eke a mụrụ ụbọchị 12 nke ọnwa Ọgọstụ 1997, nwetara ọla abụọ n'imegharị na ịgbatị ahụ nke a kpọrọ 'Gymnastics'.

O nwetara otu ọlaedo na otu ọlanchara.

Ọ bụ onye Amaukwu, Imo steeti a mụrụ na mba Amerịka.

Akano Desmond

Akano a mụrụ ụbọchị 30 nke ọnwa Septemba 1997, nwetara ihe nrite abụọ n'asọmpi ibuli igwe.

O nwetara ọlaọcha abụọ.

Ọ bụ onye Imo steeti.

Nwaokolo Augustina Nkem

Nwaokolo a mụrụ ụbọchị 12 nke ọnwa Disemba 1992, nwetara ihe nrite atọ n'asọmpi ibuli igwe.

O nwetara ọlanchara atọ.

O ritekwara ọlaedo n'asọmpi Commonwealth nke afọ 2010.

Ukeh Uchechukwu Deborah

Ukeh a mụrụ ụbọchị 12 nke ọnwa Nọvemba 1996, nwetara ihe nrite abụọ n'asọmpi 'Badminton'.

O nwetara otu ọlaedo na otu ọlaọcha.

Ọlaọcha ya bụ nke ya na Dorcas Adesokan so pịata.

Ndị a niile bụ ndị nwetara ihe nrite karịrị otu.

Ndị Igbo ndị ọzọ sokwa nweta ihe nrite dịka n'ọsọ, bọọlụ nakwa egwuregwu ndị ọzọ.

Akụkọ ndị a ga-amasị gị:

Ihe nkiri a ga-amasị gị: