You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Igbo Markets: Etu e si nweta aha ahịa anọ dị n'ala Igbo
- Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Ahịa bụ ebe ndị mmadụ na-aga ere ihe ha nwere ma zụrụkwa ihe dị ha mkpa.
N'ala Igbo, ahịa nwere mpụtara dị oke mkpa n'ihi na e kwenyere na ma mmadụ ma mmụọ na-agbakọ n'ọgbọ ahịa.
N'ọtụtụ ebe n'ala Igbo, ọgbọ ahịa bụkwa ebe a na-anọ eme emume dị icheiche n'obodo, dịka ịgba mmọnwụ maọbụ ịgbapụta egwu, dgz.
Aha ahịa e nwere n'ala Igbo bụ Eke, Orie, Afọ na Nkwọ.
Kedụ ka aha ndị a si bido?
Dịka Mazị Chiagozie Nnabuihe, onye ọkammụta asụsụ na omenala Igbo na mahadum Legọs si kwuo, nke a malitere kemgbe e kere ụwa.
Ọ kọwara na aha ahịa anọ ndị a bụ aha chi anọ nke Chukwu okike nyere ikike ilekọta ọwụwa anyanwụ, ọdịda anyanwụ, ugwu nakwa ndịda.
Ọ kọrọ sị: "Chukwu kere ụwa ebe ọ dị okirikiri, o wee zie anyanwụ ka o si n'aka nri na-aga njem ileta etu ihe siri dị n'ụwa ruo n'aka ekpe."
"Nke a mere e ji nwee ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ."
"Chukwu zikwara ọnwa ka o si n'ihu maọbụ n'ugwu na-aga njem ruo na ndagwurugwu maọbụ ndịda."
"Nke a kewara ụwa ụzọ anọ nke kpatara Igbo ji nwee ahịa anọ na-anọchịte akụkụ anọ nke ụwa."
BBC Igbo kpọtụkwara ọka nkuzi Nkechi Nwokoye, onye bụkwa onye nkuzi asụsụ na ọdịnala Igbo na mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Ọka.
Nwokoye kwuru na ahịa ọbụla nwere chi ọ bụ.
O kwuru sị: "Eke, Orie, Afọ, Nkwọ, ha niile bụcha arụsị nke nnanna anyị ha na-efe n'oge gboo."
"Nke ọbụla n'ime ha nwere ihe ọ bụ. Aha ọbụla n'ime ha nwere ihe ọ pụtara."
"Mana o nweghi onye ma ihe e jiri baa ha aha ndị ahụ maọbụ mpụtara aha ndị a."
Nkwenye ndị Igbo gbasara aha ahịa ha
Nnabuihe kọwara na ndị Igbo kwenyere na mmadụ na-adị ndụ naanị abalị anọ: Eke, Orie, Afọ na Nkwọ.
O kwuru sị: "Afọ, ọnwa nakwa izu ndị Igbo bụ naanị abalị anọ"
"Ị nọrọgodi ndụ ruo otu puku afọ, ọ bụ naanị abalị anọ."
"Nke ị nọghị n'eke, ị nọrọ ya n'orie, nke ị nọghị n'orie, ị nọrọ ya n'afọ, nke ị nọghị n'afọ, ị nọrọ ya na nkwọ."
A na-ejikwa aha ahịa agụ mmadụ aha.
Aha ndị a gụnyere Okeke, Okorie maọbụ Okoye, Okafọ, Okonkwọ, Nweke, Nworie maọbụ Nwoye, Nwafọ, nakwa Nwankwọ.
Nke ụmụnwanyị bụ Mgbeke, Mgborie, Mgbafọ, na Mgbankwọ maọbụ Mgbọkwọ.
Etu e si ehibe ahịa
Tupu e hibe ahịa ọbụla n'ala Igbo a ga-achụ aja.
Nnabuihe kwuru na ọ na-abụkarị isi mmadụ ka a na-eji achụ aja dị otu a.
Mana ọ ga-abụ isi 'onye ara', ọ bụghị onye ahụ zuru oke.
"Nke ahụ kpatara na mmadụ rịawa ara, ma o rubeghi n'ahịa tụtụrụ ihe, a ka nwere ike ịgwọta ya.
"Mana onye ahụ ruo n'ahịa tụtụrụ ihe maọbụ rahụ ụra ebe ahụ, ara ahụ agaghịzi enwe ngwọta."
Ahịa ọbụla n'oge gboo na-enwe ukwu osisi dị na ya.
Ọ bụ n'ukwu osisi ahụ ka a nọrọ chụọ aja e ji hibe ya bụ ahịa.
Osisi ahụ bụkwa ihe ịgba ama na e hibere ahịa ebe ahụ, dịka Nnabuihe siri kwuo.
Etu e si azụ ahịa mgbe gboo
Mgbe gboo, mgbe elu bụ ala ọsa, anaghị eji ego azụ ahịa.
Ihe a na-eme na ahịa oge ahụ bụ 'mgbanwe' maọbụ 'weta isi bịa were isi'.
Onye nwere ji ga-abịa gbanwere ede, ebe onye nwere anụ ga-abịa gbanwere azụ.
Mana ka oge gatụrụ, e mechara were ego ayoro were na-atụ mgbere ahịa.
Ọmụmaatụ ahịa ndị a ma ama n'ala Igbo
Ugbua, ahịa Igbo a kacha mara amara bụ otu Nkwọ Ọnịcha nke a na-akpọ "Onitsha Main Market" na Bekee.
A na-eche na ọ bụ ya bụ ahịa kacha buo ibu n'ọdịda anyanwụ Afrịka.
E nwekwara Eke Ọka, Nkwọ Nnewi, Eke Ekwulobia, Afọ Nnobi dgz. Ha niile dị n'Anambara steeti.
Ị gaa na steeti Imo, Orie Amarakụ bụkwa ahịa a ma ama na mpaghara Ọlụ dị n'Imo Steeti.
Ndị ọzọ dị n'Imo steeti bụ Eke Ọnụnwa, Afọ Ugiri, Nkwọ Achị, dgz.
Enugwu nwere Eke Obinagu, Afọ Obollo, Orie Ezeagụ, dgz.
N'Ebọnyị, ị ga-anụ maka Eke Imoha nke dị n'Onueke, Ezza, e nwekara Eke Afikpo, Orie Amasịrị, dgz.
Ndị Abịa nwere ahịa Eke ọha dị n'Aba, Orie ụgba n'Ibeku, Nkwọ Amachi na Nsulu, Ngwa, Eke Uzuakọlị dgz.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị: