Maduka Okoye emela ka agbọghọ Naịjirịa na-eti mkpụ na Twitter

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Kamgbe Vincent Enyeama wụsachara ọwa dịka ochee bọọlụ ndị otu egwu Super Eagles nke Naijiria, ịnwete ochee bọọlụ ọzọ ga-adị ka ya ahịaala nnukwu ahụ.

Nke ka njọ mere mgbe Carl Ikeme, onye nọchiri Enyeama dara n'ọrịa Leukemia.

Kamgbe ahụ ndị dịka Daniel Akpeyi, Ikechukwu Ezenwa, nakwa Francis Uzoho anwaala oke ha, mana o doro anya na e nwere ihe dị iche n'etiti 'capital B' na ọkpa ehi.

Mana anya nile nọzị n'ebe Maduka Okoye nọ, ka a mara ma ọbụ ya bụ onye nzọpụta a na-ele anya ya.

Ọ bụ n'ụbọchị 14 nke ọnwa Ọgọst ka otu na-ahazi egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ "Nigeria Football Federation (NFF)" dere aha ndị ha kpọrọ oku n'akara Twitter ha.

Maazi Okoye nwere ezigbote aṅụrị na aha ya so, makana ọ sị na oteela ya chọrọ ịgbara Naịjirịa bọọlụ.

Ka nke a mechara, ọtụtụ mmadụ, ọkachasị ụmụnwaanyị:

Ma ndị na-asị na ọ maka,

Na-eti mkpu na ọ mara mma nwoke,

Etikwa ezigbote mkpu!

Hmmm..

Nsogbu were dị nụ...

Nke mere otu onye jiri si na ihe ga-eme bụ na ụmụagbọghọ ga na ekiri asọmpị ndị Super Eagles.

Onye bụ Maduka Okoye?

Nwata nwoke a gbara afọ iri na itoolu bụ na mba Jamani ka ọ na-agba bọọlụ.

Aha otu egwu bọọlụ ya bụ Fortuna Dusseldorf II.

Nna ya bụ onye Naịjirịa mana nne ya bụ onye Jamani.

Ọ sị na Naịjirịa na-amasị ya.

N'ọnwa Mee nke afọ o dere na akara Twitter ya na ya na-ele anya ịgbara Naịjirịa bọọlụ mgbe ha zutere Sudan.

Etu e si nabata Maazị Okoye yiri etu e si nabata Carl Ikeme mgbe akpọrọ ya na oru ndị Super Eagles.