You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nigeria vs Algeria: Algeria efoola Super Eagles nku ka a na-efo ajị imi
Ọljiria ga-ezute Sịnịgal n'agba ikpeazụ dịka Riyad Mahrez ji goolu zọpụta ndị otu ya.
Ebe Naịjirịa ga-ezute Tunishia ụbọchị 17 nke ọnwa Julaị, ebe ha ga-ama onye ga-agba onye nke atọ ma nweta ọlanchara.
Goolu Mahrez nyere si na 'free kick' ọ gbara dịka Wilfred Ndidi gbaturu Ismael Bennacer.
Odion Ighalo ji penariti nye goolu ma napụta Naịjirịa n'aka ndị Ọljiria na nkeji 73, mana o zughi ịkpọba Naịjirịa n'agba ikpeazụ.
Goolu a bịara ka Aissa Mandi tinyere aka ya iji gbochie bọọlụ Oghenekaro Etebo gbara; e ji ihe nkiri Video Assistant Refree (VAR) nyochaa ya ma nye Naịjiria penariti ahụ.
Goolu a Ighalo nyere bụkwa naanị nke abụọ na-abanye n'ime poostu ndị Ọljiria kemgbe ha bịara asọmpi nke afọ a.
Bọọlụ biri William Troost-Ekong n'ahụ ma banye na neetị na nkeji 40, iji mee ka Ọljiria jiri otu ọkpụ na-emeri Naịjiria.
Cheta na ọ bụ Troost-Ekong nyere goolu Naịjirịa ji nweta mmeri n'aka Saụt Afrịka ma banye agba ọkara-Ikpeazụ a.
Ụfọdụ ndị Naịjirịa na-ewe iwe na-ekwu na ọ bụ uwe ndị Super Eagles yi mere ha ji ghara ịgbata ọfụma n'egwuregwu a.
Ha gara na Twitter na-egosi iwe ha. Lee ihe ha kwuru:
@sp_okpara kwuru na uwe a anaghị eweta ihe ọma.
@Quadriagboola gosikwara iwe ya.
@ruudboie kpọkuru ndị na-eme uwe Naịjirịa sị ha gbanwee ya makana ọ na-ebute ọdachi.
Mana ajụjụ bụzị "ọ bụ Jersey na-agba"?
Lee ihe ndị mmadụ kwuru maka ya na Facebook anyị:
Ụfọdụ ndị ọzọ malitere ịchọ Vincent Enyeama chebuuru Naịjirịa goolu.
@akaninh kwukwara otu ihe ahụ.
Kedụ etu obi dị gị ugbua?
Ndị Super Eagles ga-eji ihe niile ha nwere gbaa egwuregwu a, enweghi ihe ọzọ ga-ebute nke a, ọ bụrụ maka nkwa ndị ojiegoachụego kwere ha maka inye ha puku dọla iri ise maka goolu ọbụla ha ga-enye.