Nigeria vs South Africa: Eagles arachaala Bafana ka banana

Naịjirịa na Saụta Afrịka chipụrụ ya n'asọmpi nke agba nke anọ nke Afcon, ma gosi ha onye bụ eze.

Goolu William Troost-Ekong gbakpuru na nkeji 89 kụrụ ntu n'elu akpati ndị Saụt Afrịka bu bịa ije a.

Naịjirịa gosiri na ha abụghị mmọnwụ a na-akwa aka site n'ọkara nke mbụ mgbe Samuel Chukwueze pịakpuru goolu nke mbụ na nkeji iri abụọ na asaa.

Iji gosi na ya bụ egwu abụghị egwu a chị ụtaba n'aka agba, ndị Saụt Afrịka kpakwara ike nke ha oge Bongani Zungu nyere goolu biri n'azụ Odion Ighalo wee danyere ya.

A jụrụ ihe onyonyo VAR ma ọ bụ ha gaa n'ihu kpọọ ya goolu tupu a gụnye ya ka goolu.

Chukwueze so na ndị a kpụ n'ọnụ maka udịrị ike ọ kpara.

Ka ọ dị ugbua, Naijiria ga-ezute onye ọbụla meriri n'etiti Ivory Coast na Algeria, n'agba nke ọkara-ikpeazụ.

Lee ka o si kwuru